A kpụpụla nwoke mara nwa ya nwaanyị elu n’ike ụlọikpe

0
3

ỤLỌIKPE Majie (Ikeja Chief Magistrates Court) enyela iwu ka otu nwoke gbara afọ iri ise na abụọ aha ya bụ Sunday Anthony nọdụ n’ụlọnga Kirikiri Correctional Centre maka ịma nwa ya nwaanyị gbara afọ iri na asaa elu n’ike.

  Ndị uweojii kpụpụrụ Anthony ụlọikpe maka arụ ahụ ọ kpara.

  Magistrate M.O Tanimola nyere iwu ahụ n’ihi okwu nke ‘prosecutor’, ASP Victor Eruada bụ ka e wegara Director of Public Prosecutions (DPP) okwu ahụ maka ndụmọdụ (legal advice).

  Ya mere, Majie nyere ntụziaka ka e wegara DPP usoro ikpe ahụ maka ndụmọdụ dịka o yigharịrị ikpe ka ọ dịbazie na Novemba 12.

  Eruada nọ na mbụ kwuo na Anthony kpara arụ ahụ na Jenụwarị na Maachị, n’ụlọ ya.

  O kwuru na ya bụ arụ dịka usoro iwu na-achị steet Lagos siri dị bụ na onye mere ya na-aga nga mkpụrụ ọka.

GUO:  A kpụpụla otu nwoke ụlọikpe maka imetọ ụmụaka nwoke abụọ, o bunyekwara ha ọrịa oberenajaọcha

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here