Akụkọ iho: Onye ga-anyaba nwamba mgbirigba n’olu?

0
3
Nwanyị Loro Akwa Eke
Akụkọ Ifo

OTU oge n’obodo ụmụanụmanụ a na-akpọ Òkè. Ha kpọrọ oku dị ha nnukwu mkpa ịtụ elo maka mmekpa ahụ ha na-enwe, otu nwamba si abia eburu ha oge ọbụla dịka ihe oriri. Ya bụ nsogbu na-enyezi ha oke mmekpa ahụ nke na ọnụọgụgụ ha na-epewanyezi mpe oge ọbụla. Ha wee foro ntutu taa na ya bụ nzụkọ agaghị abịa n’isi njedebe ma ọ bụrụ na ha atụtaghị ezigbo elo otu a ga- esi kwụsi nwamba ịbịa na-eburu ha dịka ihe oriri.

  Onye ọbụla gbara nkitị, ebe niile daa jii. E mekata, otu oke welie aka elu na ọ chọrọ ikwu okwu. E nye ya ohere ikwu okwu, o bilie kwue na n’uche nke ya, na ya na-atụta elo ka ha gote mgbirigba makwụnye ya eriri nyaba nwamba n’olu ka ọ ga-abụ ọ na-abịa iburu ha, mgbirigba ahụ na-akụ, ha amara na nwamba na-abịa. Onye ọbụla aga zoo, ka ọ ghara ijidenwu ha.

  Oke nile nọ na nzuko ahụ wee wulie elu na-añụrị tie “Eee! Elo nke a amaka oo”! Onyeisi ha wee bilie kelee ha niile sị ha na elo a tụtara mara ezigbo mma ma ajụjụ ọ na-ajụ ha niile nọ ebe ahụ bụ; “Onye ga-anyanye nwamba ya bụ mgbirimgba n’olu”? Onye lee ibe ya, ibe ya e lee ya. Chakpii!

GUO:  Akụkọ iho: Ihe mere nwamba enweghị enyi n'ala ụmụanụmanụ

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here