DSS a tọhapụla Chiwetalu Agu

0
2
Chiwetalu Agu (nke atọ n'aka nri), mgbe ya na ndị nke ya na-enwe ọńụ ka a tọhapụrụ ya

A TỌHAPỤLA onye ome ejije a maara nke ọma n’ala anyị, Chinwetalu Agu bụ onye ndị Department of State Services (DSS) nwụchịkọrọ.

  Onyeisi òtù Actors Guild of Nigeria (AGN) Ejezie Emeka Rollas kwuputara nke ahụ.

  N’ozi ọ kụpụụrụ ndị ntaakụkọ, Rollas kwuru na òtù ahụ agbaala mbọ ọzọ wee hụ na a tọhapụrụ ome ejije (actor) ahụ.

  Ozi ahụ tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ kwuru sị: “N’aha òtù anyị, mụ na onye òtù m, nnukwu onye enyemaka pụrụ iche n’ihe gbasara ndị agha, mmekọrịta gọọmenti dị iche iche nye onyeisi AGN (Senior Special Assistant on Military Affairs and Inter Govenmental Relations to the AGN President), Steve Eboh, nọ Abuja ịnabata Maazị Agu taa.”

  Onye ome ejiji ahụ kelere Chineke maka ịzọpụta ya na nsogbu ahụ, ma tokwaa ọchịchị nke Actors Guild of Nigeria nke Ejezie Emeka Rollas nọ n’isi ya maka oke mbọ ha gbara iji hụ na a gbapụtara ya n’ebe ahụ a kpọchiri ya.

  Ka anyị cheta na ndị ọrụ agha nwụchịkọrọ Agu n’izuụka gara aga ka ọ nọ na-agbara ndị mmadụ saraka (charity mission) n’Upper Iweka, Onitsha, steeti Anambra maka iyi uwe njirimara IPoB.

  Ebe ndị agha Nigerian Army n’ozi nke ha kwuru na a nwụchikọrọ onye ome ejije ahụ ka ọ nọ na-akpọku ndị mmadụ ka ha kwado Indigenous People of Biafra (IPoB).

  Otu o sila dị, ọtụtụ ndị mmadụ sonyere Agu na-ańụrị maka ntọhapụ ahụ a tọhapụrụ ya.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here