Na Obodo ụfọdụ, nwoke nwere ike ịlụ ụmụnwaanyị abụọ otu ụbọchị

0
2

NDỊ isi ojii bụ ndị a maara ka ndị na-alụ ọtụtụ nwaanyị. Ma n’ihi okpukperechi nke ụka Christ ọnọdụ ahụ belatara. N’oge ugbu a, ọtụtụ na-alụzị otu nwaanyị.

  Otu o sila dị, e nwere omenala dị iche iche n’ihi na nkụ dị na mba na-eghere mba nri.

  A bịa na steeti Delta, o nwere obodo abụọ na-alụ ọtụtụ nwaanyị n’otu oge.

  Igbide na Enwhe dị n’okpuru ọchịchị Isoko na steeti ahụ na-alụ ọtụtụ nwaanyị; ka ọ dị ugbu a, ha na-eme ihe n’isi nwaanyị abụọ ma ọ bụ karịa n’otu ụbọchị site na nkwado ezinaụlọ ụmụnwaanyị ndị ahụ.

  Ọ bụ eziokwu na onweghị onye nwere ike ịkọwa oge mmadụ ịlụ ọtụtụ nwaanyị n’otu ụbọchị malitere n’obodo ndị ahụ, a chọpụtara na ọ bụ otu nwoke onye Uzere nke dị n’ogbe ahụ malitere ya. Kemgbe ahụ, ya bụ ihe bụzi egwu eji n’ihi na ọtụtụ ụmụikorobịa gbasoro usoro ahụ nke bụ ịlụ karịa otu nwaanyị, n’otu ụbọchị.

  Ihe karịrị ụmụnwoke iri agbaala nkwụ n’isi ụmụnwaanyị abụọ n’otu ụbọchị n’Igbide ebe ihe dịka ụmụnwoke isii merela otu aka ahụ Enwhe.

  Maazị Ochuko Uloho mere nke ya n’onwe Epure afọ a oge ọ lụrụ ụmụnwaanyị abụọ, otu ụbọchị n’Enwhe.

  Uloho gwara ndị ntaakụkọ na ya haziri ihe niile nke ọma dịka o kwuru sị: “Oge ọbụla ị chọrọ ime ya, Ị ga-ahazi ya nkeọma. Anyị si n’otu ogbe, nke pụtara na ị ga-aga na be onye nke mbụ gị na ha ekwuo na ime ego n’isi nwaanyị ga-abụ site n’ụtụtụ ruo n’etiti ehihie (12: noon). Onye nke ọzọ ga-abụ n’elekere anọ nke uhuruchi. N’echi ya ị kpọọ oriri na ọńụńụ.”

  Ọ gakwara n’ihu gbaa ama na tupu ya alụọ ụmụnwaanyị abụọ otu ụbọchị, na ọ nweela onyeisi ụka (general overseer) lụrụ ụmụnwaanyị anọ n’otu oge n’Enwhe. Ọ kọwara na onyeisi ụka ahụ emeghị ka ụwa mata banyere alụmalụ nke ya.

  O kwuru sị: “Onyeisiụka ahụ emeghị ka a mata (publicity), eleghị anya ọ ga-abụ maka na ọ bụ onye amụma. Abu m nwoke mbụ mere ya n’ihu ọha na eze. Emere m ịgba nkwụ m n’Epure 11, 2021.

  Otu o sila dị, o kwuru na ebumnuche o jiri lụọ ụmụnwaanyị abụọ bụ ka ya wee mee ihe karịa nna ya onye nke o sịrị na ọ lụrụ otu nwaanyị dịka o kwuru sị: “Nna m lụrụ otu nwaanyị nke mere na m kwesịrị ịlụ abụọ; ekwesịrị m ime karịa nna m. Oge nna m dị ndụ, ọ gwara m ka m bie ndụ karịa ya.”

  N’akụkụ nke ya, Maazị Ekpe Akpove onye nke gbara alụmalụ ya n’anwụ na nzikọrịta ozi onyanwudude oge ọ lụrụ ụmụnwaanyị abụọ otu oge n’ọnwa Ọgọstụ n’Igbide kọwara na ya mere ya n’ihi ịhụnanya o nwere n’ebe ụmụagbọghọ abụọ ahụ, Kome na Maro nọ.

  Akpove, onye gụrụ ihe ọmụmụ Business Administration ma nweta nzere National Diploma (ND) na Delta State University, Ozoro nke bụzi University of Science and Technology bụ onye na-amụ banyere ịzụ azụ n’Igbide.

  Ya bụ nwoke gbara afọ iri atọ na anọ kwuru na ya matara Kome n’afọ 2008 tupu ya wee mata Maro na 2010. ụmụnwaanyị abụọ ndị ahụ mụtaara ya ụmụ  atọ n’otu n’otu tupu o kpebie ịkapịwa ya bụ njem ọnụ.

  O kwuru sị: “Ahụrụ m ha n’anya nhatanha, ọ bụ ya mere m jiri kpebie ịlụ ha. Ha abụọ mụtaara m ụmụ atọ n’otu n’otu. Ya mere, e mere m ihe dịka o kwesịrị wee mee ego n’isi ha, lụọ ha dịka iwu kwuru (legally).

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here