Ndị uweojii ejidela ndị a na-enyo ènyò makaigbu ndị mmadụ n’Abuja

0
2
Ndị omekome ahụ e jidere

 AKA ndị uweojii akpàrala mmadụ atọ a na-enyo enyò na ha bụ ogbu mmadụ, ma bụrụkwa ndị aka ha dị n’ọnwụ nwoke ahụ a mà àmá na-esi nri gwòògwòò n’Abuja, bụ Maazị Vincent Eluagu Chukwuemeka, onye e ji ‘Chef Emeka’ wee mara.

  Ọ dị ncheta na a hụrụ ozu Chef Emeka n’ime be ya dị n’Abuja, n’abalị iri abụọ nke ọnwa Ọgọstụ ahọ a n’Abuja bụ isi obodo ala Nigeria.

  Nke a mezịrị ndị uweojii, ngalaba FCT jiri màlite ime nnyocha miri èmì banyere ọnwụ mberede nwa amadi ahụ, ji chọpụta ka o siri nwụọ, ihe kpatara ọnwụ ya, maọbụ ndị aka dị na ya bụ ọnwụ.

  N’ozi a kụpụụrụ ndị nta akụkọ na nsonso a n’Abụja site n’aka onye na-ahụ mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na FCT, bụ DSP Josephine Adeh, e mere ka a mara na ndị uweojii ahụ anwụchiela mmadụ atọ a na-enyo ènyò na aka ha dị n’ọnwụ nwa amadi ahụ.

  Ọ kpọpụtasịrị aha ndị ahụ dịka Kingsley Obinna (gbara ahọ iri abụọ na anọ), Musa Tanimu (gbara ahọ iri abụọ na ise) na Mohammed Sha’aba (gbara ahọ iri abụọ na isii).

  Ọ kọwara na site na nnyocha ndị na-ahụ maka igbu ọchụ ụlọ (homicide) na ngalaba ‘Criminal Investigations Department (CID)’ mere, na a chọpụtara etu ndị ahụ siri wee gbuo nwoke ahụ n’ụlọ be ya.

  O kwukwazịrị na onyeisi ndị uweojii na FCT, bụ CP Babaji Sunday akasiela ma ka na-akasìkwa ndị ezinụlọ na ndị enyì nwoke ahụ obi, na-àgbàkwa ha uwe ka ha kara obi, n’ihi na ha ga-enweterịrị ikpe nkwụmọtọ.

  O kwekwara nkwà na a ga-akpụpụ ndị ahụ ụlọikpe ma e mechaa nnyocha banyere ihe ahụ ha mere; ọbụladị dịka ọ dụkwàzịrị ndị mmadụ ọdụ ka ha na-enye ha mkpesa na ozi dị mkpa oge ọbụla ha hụrụ onwe ha n’ọnọdụ ntụmadụ na ọnọdụ ndị ọzọ dị añaa, site n’ịkpọtụrụ ákàrà 08032003913, 08061581938, 07057337653 maọbụ 08028940883.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here