N’Osun, ndị nta ejidela òtù ụmụnwaanyị ndị ohi

0
3

NDỊ na-achụ nta (hunters) n’Oshogbo, steeti Osun anwụchikọọla òtù ndị ohi ụmụnwaanyị (female robbery gang), mmadụ atọ ka ha gara ohi n’ụlọ mmadụ.

  Onyeisioche òtù ndị na-achụ nta n’ala anyị (Hunters Association of Nigeria) na steeti ahụ, Maazi Hammed Nureni, kwuputara na nnwụchịkọ ahụ bụ eziokwu ma jụ ikwu banyere ya gaa n’ihu.

  O kwuru na a hafeela ha n’aka ndị uweojii maka nnyocha dịka ọ kọwara na ọ bụ n’ihi ọnọdụ ahụ ka ya agaghị eji kwu maka ya gaa n’ihu (security reasons).

  Otu onye nọ ka o mere achọghị ka a kpọọ aha ya kwuru na ụmụnwaanyị ahụ nọ n’agbata afọ iri na anọ were ruo iri na isii bịara ohi n’ụlọ dị n’okirikiri Aresa, ebe a nọ were nwụchịkọọ ha. Dịka o siri kwu, ụmụnwaanyị ahụ bụ ụmụaka ndị izu ohi dogoro anya.

  O kwuru sị: “Ka ha zuchagoro ohi n’otu ụlọ dị n’ogbe ahụ, onye nwe ụlọ ahụ nke bụ agadi nwaanyị malitere iti mkpu oge ha gbara ọsọ. Ọ ga-abụ na ndị ohi ahụ nọ na-eleta ka ihe si aga n’ụlọ onye ha zuru ohi maka na ọ kpọrọ oriri na ọńụńụ ụbọchị ahụ. Otu onye n’ime ha ga-ama ebe o debere ego o nwetara n’emume ahụ. Ọ bụ ya ga-abụkwanụ onye kpọrọ mmadụ abụọ ndị ọzọ ka ha soro ya gaa ohi ahụ. Mmadụ abụọ n’ime ha si na windo banye, ebe otu onye nọ na mpụta na-eleta ka ihe si aga. Ha wetara ego ahụ n’enweghụ nsogbu n’ihi na ọkụ adịghị, ma ka ha na-achọ ịpụ n’ụlọ ahụ otu onye n’ime ha zọrọ nwaanyị ahụ nọ n’ụra ụkwụ, o wee tibe mkpu.”

GUO:  E jidela mmadụ anọ na-apụnara mmadụ ụgbọala n'Anambra

  Otu o sila dị, ọ kọwara na ọ bụ mkpu nwaanyị ahụ mere ka ndị na-achụ nta wụchaa ebe ahụ. Ya mere, a nwụchikọrọ otu onye n’ime ha n’elekere anọ nke ụzọ ụtụtụ oge ọ na-achọ ịgbapụ n’ogbe ahụ. E mechaa kpọga ya n’ogige uweojii ebe ọ nọ kpọọ aha mmadụ abụọ ndị ọzọ, ka ndị uweojii na ndị nta na-agba ya ajụjụ ọnụ.

  E mechara nwuchịkọọ mmadụ abụọ ndị ọzọ ahụ n’Olugun na Sasa dịcha n’Oshogbo.

  Ọ gara n’ihu kwuo: “Ha atọ bụcha ụmụ na-eto eto. Otu dị afọ iri na anọ, ebe mmadụ abụọ ndị ọzọ dị afọ iri na isii n’otu n’otu.

  Oge ozi ruru anyị aka, okwuputa okwu ndị uweojii steeti ahụ kọwara na ha enwetabeghị ozi banyere ọnọdụ ahụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here