Nwaakwụkwọ egbuola onwe ya maka na enyi ya nwoke gbahapụrụ ya

0
2
Olivia, wepụrụ ndụ ya

NWAAKỤKWỌ na-agụ Library and Information Science n’ụlọakwụkwọ Akanu Ibiam Federal Polytechnic, Uwana, na steeti Ebonyi egbuola onwe ya n’ihi obi mgbawa.

  Olivia James, onye na-agụ akwụkwọ ma na-agbakwa mbọ site n’ime achịcha (cake) na ụmụ ihe ndị ọzọ ka e kwuru na ọ ńụrụ ‘sniper’ n’ihi na enyi ya nwoke gbahapụrụ ya ka ọ gachara abalị olemole o mechara ncheta ọmụmụ ya.

  Akụkọ kọrọ na ka o mcehara ncheta ọmụmụ ya n’Oktoba 6, na ya na enyi ya nwoke, Henry, nwere nghọtahie nke mere na o kwezighị aza oku ekwenti ya; mgbe ọ bụla ọ kpọrọ, ọ bụzi nwaanyị na-aza ya.

  Tupu o wepụ ndụ ya, o zigaara otu enyi ya ozi ma gwa ya ihe o bu n’uche ime, ma n’ihi na enyi ya ahụ anọghị n’ikuku ‘online’ n’oge ahụ ọ hụghị ya, ma mgbe o mechara n’ikpeazụ hụ ozi ahụ ma gbara gaba na nke Olivia, ọbụrụ na ọ ńụọla ‘sniper’. Ka ọ dị ugbu a, Henry nọ n’ọsọ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here