Nwoke egbuola nna ya maka inye ya isi ọkụkọ

0
2

OTU nwoke gbara afọ iri abụọ na isii aha ya bụ Godwin Matthew, egbuola nna ya gbara afọ iri isii na anọ, Matthew Audu maka inye ya isi ọkụkụ o gbuuru obere nwanne ya. Njinji ahụ jiri  n’Akure dị na steeti Ondo.

  Okwuputa okwu kọmandi uweojii steeti ahụ, Funmi Olunlami n’ozi ya kwuru na e wetara mkpesa banyere igbu ọchụ ahụ n’ogige ndị uweojii Ala Police Station, ma kọwaa na ọ bụ nwunye onye nke nwụrụ anwụ wetara ya.

  Odunlami kwuru sị: “Ka Onwa Septemba dị n’abalị iteghete, e wetara mkpesa banyere igbu mmadụ n’Ala Divisional Headquarters site n’aka otu nwaanyị aha ya bụ Oriakụ Christiana Audu Matthew ma kwuo na nwa ya nwoke, Godwin Matthew gbara afọ iri na isii na nna ya hapụrụ ụlọ gaa n’ugbo ezinaụlọ ahụ nwe. Na e mechara chọpụta na nwa ahụ ji mma gbuo nna ya.

   Ka a na-agba ya ajụjụ, ya bụ onye kpara arụ kwuru na nna ya gwara ya ka o gbuo ọkụkọ ka e were meere nwanne ya nwoke gbara afọ asaa, Emmanuel Audu oriri. Na ka e mechara na ihe nna ya nyere ya bụ isi ọkụkụ, na ọ bụ n’ihi nke ahụ ka o jiri gbu nna ya.”

GUO:  Nwokorobịa e gbuola nna ya n’Abatete

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here