Okpuru osisi: Uru ọ bara

0
2

OKPURU osisi bụ ebe ndị mmadụ na-anọ ezu ike. Mgbe ọ bụla anwụ na-acha ọ bụ n’okpuru osisi ka ọ ga-abụ ị nọrọ ahụ ajụọ gị oyi, I nwee ike rahụ ụra nke ọma.

  Osisi bara nnukwu uru. Ọ dị mkpa na ndị mmadụ ga na-akụ osisi gburugburu ha. E wepụ osisi, nsogbu ga-adị n’ihi na ọ bụ ya na-enye aka na ekesasị ikuku.

  Ndị Igbo n’oge mbụ na-anọ n’okpuru osisi eme nzukọ. Oge ahụ osisi na-adịgasị n’ama obodo. N’oge ahụkwa, ọ bụladi n’ụzọ e si aga ugbo, echu mmiri were dịrị gaba, ndị mmadụ na-anọ n’ukwu osisi ezuru ike. Ha na-echekwube ya echekwue. Ndị si ugbo alọta maọbụ ụmụaka churu mmiri na-apụta kwụsị, zuo ike n’ukwu osisi tupu ha lawa be ha.

  Ụmụaka na-anọkwa n’ukwu osisi egwu egwuregwu. Ọ bụladị n’ụlọakwụkwọ a na-akụgazi osisi gburugburu niile nke na oge ụfọdụ, a na-anọ na ya akụziri ụmụakwụkwọ ihe.

  Otu aka ahụ ka ọ dịkwa n’ụlọụka. Okpuru osisi ka ndị mmadụ na-agbakọ ma a gbasaa ụka kpaa ihe dịịrị ha. Mgbe ụfọdụ ka a na-ama n’ọkwa sị na a chọrọ ịhụ ndị dị otu a n’okpuru ukwu mango ebe a chọrọ ịhụ ndị ọzọ n’okpuru ukwu furutu, ma a gbasaa ụka.

  Ihe ndị a niile bụ uru dị n’okpuru osisi. E wezụga ya, anwụ ga na-enye ndị mmadụ nsogbu ịgbakọ kpaa ihe dịịrị ha.

  N’ụwa taa, a na-achọzị okpuru osisi mma. Ụfọdụ na-arụ oche ma chọọ ya mma nke na a na-ejizi ya eme ogige ‘garden’. Ọtụtụ okpuru osisi bụzi ebe a na-anọ emerube emume obi ańụrị dịka ncheta ọgbụgba afọ, ịkwe nkwa alụmdi, w.d.g.

  N’ezie, okpuru osisi sozi n’ebe mmadụ nwere ike ịnọ nwee ańụrị, zuo ike, ya na ndị enyi ya erie, ńụọ ma ńụrịkwaa.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here