Òtù egwuregwu Keep Fit emeela Ịwa ji, nye ndi mmadụ onyinye nkwanye ugwu

0
3
Nnabuife (nke asaa n'aka ekpe), Onyeadi (nke asaa n'aka nri) na ọtụtụ ndị ọzọ bịara mmemme ahụ

NDỊ òtù Keep Fit Sports Club, Awka bụ ngalaba Capital Sports Club, Awka, nọ na Satọdee, mee emume Ịwaji Ọhụrụ (New Yam Festiva) 2021. Ha ji mmegharị ahụ nke na-eme ka ọbara mmadụ gbagharịa nke ọma (physical fitness) wee malite ya ma were nkwanye ugwu ‘award’ nke ha nyere ụfọdụ ndị otu ha maka mbọ ha, wete ya na njedebe.

  Emume ahụ nke e hibere n’afọ 2020 bụ n’ụlọezumezu Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC), Awka, ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa, SportsLightXTRA na Homeland, ka a nọrọ wee mee ya.

  Ndị ọnụ ruru n’okwu sị n’ugwu na ndịda wee bịa maka oke mmemme ahụ. Kaptịn nke Keep Fit Sports Club ma bụrụkwa onyeisi (MD/Chief Executive Officer) ANPC, Sir Chuka Nnabuife kọwara na Keep Fit bụ ngalaba Capital Sports Club nke e hibere iji kesaa mmụta banyere mkpa mmadụ imegharị ahụ (exercise) bara.

  O kwuru sị: “Otu a bụ otu ọnụọgụ ya erughị mmadụ narị abụọ. Anyị na-ezukọta izuụka ọbụla iji megharị ahụ na mkpuruobi. Ọ bụ òtù ndị ma ebe ha siri pụta. Ụfọdụ n’ime anyị abụghị ndị Igbo. Anyị chọpụtara na emume ‘Iri Ji’ bụ oke emume n’ala Igbo. Ọ bụ n’ihi nke a mere na afọ ọbụla, oge emume iri ji ọhụrụ ruo, anyị emee nke anyị.”

  N’okwu nke ya, onye jibu ọkwa dịka onyeisi zuzugbe (President-General),  Nsugbe ma bụrụkwa onyeisi Capital Sports Club, Obiora Onyeadi kọwara Capital Sports Club dịka nne mụtara Keep Fit Club. O toro ha maka mbọ ha na-agba site n’ịmịta ezigbo mkpụrụ.

GUO:  Otu Keep Fit Sports Club, Awka emeela ịwa ji nke afọ 2020

  Onyeadi kọwara na ihe eji eme emume ahụ afọ ọbụla bụ iji kwado oke omenala Igbo dịka o kwuru sị: “Anyị agaghị ekwe ka omenala anyị nwụọ, ebe ọ bụla anyị hụtara onwe anyị. Ndị ọcha gosịrị anyị omenala ha, anyị gbasoro ya. Anyị kwesịrị igosi ụwa emume iri ji ọhụrụ ka ha wee mata omenala anyị. Obi bụ m ańụrị ịnweta onyinye nkwanye ugwu ‘award’ maka na ọtụtụ ndị anyị na ha malite òtù a anọghị ebe a ma ana m ekele Chineke na anọ m ebe a taa.”

  Odeakwụkwọ ma bụrụkwa onyeisi Anambra State Primary Health Care Development Agency, Dọkịnta Oriakụ Chioma Ezenyimulu kọwara emume ahụ dịka nke dara ụda. Ọ kọwara emume ịwaji n’omenala Igbo dịka nke na-egosipụta mmalite ezigbo ihe ma kwuo na ọ ga-eweta ezigbo ihe n’òtù Keep Fit Sports Club dịka ha chetara omenala.

  Onyeisi nhazi (Director of Social and Welfare), Capital Sports Club, ngalaba Keep Fit, Kenechukwu Henry, gosipụtara ọńụ na afọ ojuju o nwere na mmemme ahụ nke gara n’udo.

  N’akụkụ nke ya, ‘Coach’ òtù abụọ ahụ Emeka Ementa kwuru na nke afọ a darụ ụda karịa dịka ọ kpọkuru ndị mmadụ ka ha sonyere ha, n’imegharị ahụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here