Ndị mmadụ etoola Chineke dịka Fada Egbeonu mere ncheta afọ iri abụọ na ise o chiri ụkọchukwu

0
10
Fada Egbeonu (n'etiti), mgbe ọ na-apụta n'ọgbọ na mmemme ahụ

Ọ BỤ emume ọńụ na ịtụrụ Chineke mmamma dịka Fada Longinus Uchenna Egbeonu mere emume icheta iri afọ abụọ na ise o chiri ụkọchukwu (silver jubilee).

  Ọ bụ na Satọdee ọnwa Ọktoba dị n’abalị iteghete ka a nọ n’ụlọụka St Michael’s Parish Umueze-Uga, nke dị n’okpuru ọchịchị Aguata na steeti Anambra wee mee oke mmemme ahụ.

  Fada Egbeonu kelee Chineke onye debere ya ndụ, onye mere ka mmemme ahụ were ọnọdụ n’ozuzu oke. O kwuru sị: “Ekele dịrị Chineke, onye ji ji, jide mma, onye ọ wanyere o rie. Otito niile, mbuli elu na ịja mma bụrụ nke ya n’aha Onywenweanyị Jesu Kristi.”

  O kelere Bishọp dayọsis Ekwulobia bụ Most Rev Peter Okpaleke tinyere ndị Bishọp niile ọ gafere n’okpuru ha, ndị gụnyere Archbishọp Albert Obiefuna na Bishọp Simon Akafor bụ onye chiri ya ụkọchukwu.

  Ọ gara n’ihu kelee ndị Fada niile kuziiri ma gbaziere ya, tinyere ndị zụrụ ya na ndị niile nyeere ya aka ịza oku Chineke kpọrọ ya.

  Mgbe ọ na-ekwu okwuchukwu n’aja maasị dị asọ, Fada John Umeojiakor kọwara Fada Egbeonu dịka ụkọchukwu gbasiri ike, onye rurula ọrụ dịka ụkọchukwu n’ugbo Chineke afọ iri abụọ na ise n’ime ihe iche aka mgba niile, ma dịrịkwa ndụ taa dịka ụkọchukwu, na-aga n’ihu. O kwuru sị na ọ bụ ‘Egbeonu’ n’eziokwu n’ihi na ọ ma ka e si ahazị okwu.

  Fada Umeojiakor gara n’ihu kọwaa na njem ụkọchukwu adịghị mfe dịka ọ kpọkuru ndị mmadụ ka ha na-asọpụrụ ndị ụkọchukwu. O kwuru sị: “Mgbe ọbụla ị hụrụ ụkọchukwu, cheta na ọ họrọla ụzọ ibi ndụ ime mmụọ. Jiri ọńụ na nsọpụrụ nabata ụkọchukwu ọbụla maka ihi onye ọ na-agbara odibo. Na-ekperenụ ndị ụkọchukwu ekpere.”

GUO:  Fada Egbeonu ga-eme afọ iri abụọ na ise o chiri ụkọchukwu

N’akụkụ nke ya, ụkọchukwu nke Immaculate Heart Parish Uga, onye bụ ‘dean’ Uga deanary, Fada Chukwuma Ofojebe kwuru na Fada Egbeonu ji obi ya niile za oku Chineke kpọrọ ya. Ya mere, o kelere Chineke maka afọ iri abụọ na ise ọ nọrọla dịka ụkọchukwu ma rịọ amara Chineke n’afọ ndị dị n’ihu, tinyere ka ya na ndị ọ na-agbara ụkọ ruo alaeze eluigwe, n’ikpeazụ.

  N’oziekene nnabata si n’aka ụlọụka St Michael’s Parish, Umueze-Uga nke odeakwụkwọ P.P.C, Chidoziem Umeugo gụpụtara, ọ rụtụrụ aka na Fada Egbeonu akpaala ike dị egwu n’ime ihe erubeghị otu afọ. Tinyere ihe ndị ọzọ, o kwuru sị: “Fada Egbeonu na-eje ihe n’oge, ọ na-akwado Maasị nke ọma, okwuchukwu ya na-emetụta na mkpụrụobi, ọ na-aza oku ileta ndị ọrịa ‘sick-call’ ọ bụrụgodu na ndeeri, ọ hụrụ na a gbapụrụ mmiri (borehole) na parish anyị bụ nke na-enye ndị obodo ezigbo mmiri, o tinyere ‘sola panel’nke na-enye parish ọkụ awa iri abụọ na anọ (kwa ụbọchị), Fada Egbeonu akuzierela anyị ndị St Michael uru ọrụugbo bara, maka ya onwe ya bụ onye ọrụ ugbo, ọtụtụ ndị dara mba n’ụka malitekwara bịawa ụka n’ihi oke ịgba mbọ ya.”

  N’okwu nke ya, onyeisioche mmemme ahụ, Ọkaiwu (Barr) Victor Ezeonwumelu toro Fada Egbeonu maka ọrụ ọma ya niile. Ọ kwuru sị: “Ọ bụ onye mgbasa oziọma enweghị atụ. O nwere ọkpụkpọ oku mkwuwapụ okwu. Ọ ga-abụ ọka ibe na ụzọ ndụ ọ họọrọ, nke a bụ ekpere m n’isi ya.”

  N’akụkụ nke ha n’ajụjụ ọnụ a gbara ha iche iche, Linus Egbeonu na Nicholas Egbeonu ndị Ibughubu Umuchu kelere Chineke onye mere ka ihe niile kwe omume ma gosipụta ọńụ maka ịdị ndụ na ahụike wee soro ụkọchukwu nwanne ha nwoke ńụrịa dịka ọ na-echeta afọ iri abụọ na ise o chiri ụkọchukwu.

GUO:  Fada Egbeonu ga-eme afọ iri abụọ na ise o chiri ụkọchukwu

Raphael Ndubisi, bụ ‘kati’ lara ezumike nka si St Clement Parish Umuogem-Ufuma kwuru sị: “Fada Egbeonu bụ mmadụ ọha. Ọ kpara ike site n’ihibe ụlọkawụkwọ na parish anyị. Ọ bụ ya bidoro New Generation International School, Ufuma. Ọ ga-adịrị ya mma. Ana m agọrọ ya ọfọ ogologo ndụ na ahụike.”

  William Nzeakor si All Saints Parish, Awgbu ma bụrụkwa onyeisioche Awgbu deanary C.M.O kọwara na ọ bụ na parish ha ka emume ahụ gaara ịkpọtụ ma ọ bụrụ na ekewaputaghị dayọsis Ekwulobia, nke mere ka Fada Egbeonu hapụ parish ha. Otu o sila dị, ọ gọọ ya ọfọ ọma ma kpee na Chineke onye kpọrọ ya oku ga-enye ya ogologo ndụ.

  N’akụkụ nke ha, Gregory Mmuoneme na Oriakụ Victoria Ibeneme si St Patrick’s Parish, Agulu gakwara n’ihu gbaa ama ọrụ ọma Fada Egbeonu rụrụ mgbe ọ nọ na be ha, nke gụnyere ịzọ ndụ site n’ịkpọga onye ọrịa ụlọọgwụ ma na-eme ihe niile dị na ya.”

  Ihe pụrụ iche e mere na mmemme ahụ gụnyere egwu ọdịnala na egwu baandị si parish dị iche iche Fada Egbeonu rụrụ ọrụ.”

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here