N’Enugu, onyenkuzi lara ezumike nka egbuola nwa ya nwere ọrịa isimgbaka

0
8

NDỊUWEOJII anwụchikọọla otu nwoke aha ya bụ Ikechukwu Nwobodo, na ndị ọrụ nchekwa ogbe ‘vigilante’ abụọ maka igbu nwa ya nwoke gbara afọ iri atọ na abụọ, aha ya bụ Chika Nwobodo n’Ogbozinne-Ndiagu, Akpugo n’okpuru ọchịchị Nkanu West na steeti Enugu.

  Ikechukwu, bụ onyenkuzi lara ezumike nka n’ọrụ kwuru na ya gburu nwa ya nwoke na Monde ọnwa Ọktoba dị n’abalị iri na otu site n’enyemaka ndị ọrụ nchekwa ogbe maka na nwa ya nwoke nwere ọrịa isi mgbaka.

  A chọpụtara na ọ bụ n’abalị ụbọchị Ikechukwu si ụlọọgwụ ebe a na-agwọ ya ọrịa isi mgbaka (psychiatric hospital) lọta ka nna ya na ndị ọrụ nchekwa gbara izu kee ya ụkwụ na aka. Nna ya ji igwe (iron rod) kurie ya isi nke mere ka ọ gbaa ọbara ganye n’ọnwụ.

  Onye uweojii na-ahụ maka ọdịmma ha na ndị mmadụ na steeti Enugu, ASP Dan Ndukwe kwuru na a nwụchikọọla mmadụ atọ banyere ya bụ ihe, dịka ndị ọ dị n’aka na kọmandị ahụ ‘Criminal Investigation Department (CID) maliterela ịma imi n’ala iji chọpụta otu ya bụ mmiri siri baa opi ụgbọgụrụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here