Welatanụ aka n’ịchọ mma ụbọchị nhọpụta ọchịchị: INEC gwara ụmụnwaanyị Anambra ga-atụ akwụkwọ

0
10

N’IHI ntuli akwụkwọ nhọpụta ọchịchị nke na-abịa na Nọvemba 6 na steeti Anambra, n’afọ a bụ 2021 ndị ụlọọrụ ọ dị n’aka Independent National Electoral Commission (INEC), akpọkuola ụmụnwaanyị (female voters) steeti ahụ ka ha ghara ịchọ mma n’ihu ha ụbọchị ahụ.

  Ụlọọrụ ahụ kọwara na ọ bụ ka ọ ghara igbochi akọrọngwa ha ji arụ ọrụ ‘Bimodal voter’ bụ nke a ga-ebute maka isete ihu ndị mmadụ ụbọchị ahụ, ịrụ ọrụ.

  N’okwu ya n’ọgbakọ nkuzi ‘voter education and sensitisation forum’ nke a chịkọbara n’Awka maka ndị mmadụ nwere nkwarụ (persons with disabilities) na òtù ụmụnwaanyị. Osote onyeisi INEC steeti ahụ ‘Gender Desk’, Chika Osuji kọwara na a ga-eji BVAS rụọ ọrụ na nhọpụta ọchịchị ahụ iji mee ka ndị na-atụ akwụkwọ jiri ‘fingerprints’ oge a ga-eme nnyocha ‘accreditation’.

  O kwuru sị: “Ama na ọtụtụ ụmụnwaanyị agaghị enwe ike ịkpọta ndị ọchọmma (make-up artists) n’ihi na ọnọdụ ngagharị agaghị adịcha ụbọchị ahụ; mana maka ndị agaghị anọlị n’achọghị mma, anyị na-arịọ ụnụ ka ụnụ welata aka otu ụnụ si ete ihe n’ihu. Ọ bụrụ na anyị enweghị ike ịgụta akara aka ụnụ anyị ga-akọta ihu ụnụ, ma ọ bụrụ na anyị enweghị ike ịkọta ihu ụnụ, ịbụghị onye edebanyere aha ya maka ịtụ akwụkwọ, nke bụ na anyị agaghị ekwe ka ị sonye n’ihe a na-eme. Ọ bụ oke na ọrụ anyị dịka ụmụnwaanyị iji nhọpụta ọchịchị a kpọrọ ihe, site n’isonyesi ike ma tụnye akwụkwọ anyị.”

  Osuji gara n’ihu kọwaa na ha agbaala mbọ dị egwu iji mee ka ụmụnwaanyị sonye n’ihe a na-eme nke gụnyere ime ka òtù ụka, òtù ụmụnwaanyị, ndị eze ọdịnala na ndị ndu obodo na-enye ha nkuzi banyere ọrụ ha na nhọpụta ọchịchị.

GUO:  Ndị omekoome agbaala ụlọọrụ INEC abụọ ọkụ n'Ebonyi

  Ndị chịkọbara nkuzi ahụ bụ International Foundation for Electoral Systems, United States Agency for International Development na Consortium for Elections and Political Process Strengthening.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here