A nwụchikọọla nwaanyị maka iji agụba karie nwata nwoke ahụ

0
8
Kehinde na Adelowo kara ya agụba n'ahụ

 NDỊ uweojii anwụchikọọla otu nwaanyị aha ya bụ Shade Adelowo, gbara afọ iri atọ na otu maka iji agụba (razor) karikọọ nwata nwoke, Kehinde Ojo gbara afọ iri na otu, ahụ. Ya bụ ihe mere na steeti Ogun.

  Nwaanyị ahụ onye nke a kpọchiri n’ogige ndị uweojii Oke-Aro Divisional Headquarters kwuru na nwata nwoke ahụ bụ nwa onye agbataobi ya zuru puku naịra atọ (3,000) n’akpa ya.

  Dịka okwuputa okwu ndị uweojii na steeti ahụ, DSP Abimbola Oyeyemi siri kwu, a nwụchikọrọ nwaanyị ahụ ji ụmụ abụọ onye bi n’Agbado n’ihi mkpesa nke nne nwata nwoke ahụ wetara. Ọ kọwara na nwaanyị ahụ kwuru na onye kara nwa ya agụba sị na nwa ya zuuru ego ya dịka o mere ka ndị uweojii mata na nwanyị ahụ bụ onye agbataobi ya nwa ya na-anọ na nke ya mgbe ọ bụla ọnọghị n’ụlọ.

  Ayeyemi gara n’ihu kwuo sị: “Ka e nwetachara mkpesa ahụ, DPO Agbado Divishọn, CSP Kehinde Kuranga zigara ndị ọrụ ya n’ebe ihe ahụ mere, nwụchikọọ nwaanyị ahụ. Dịka a gbara ya ajụjụ, nwaanyị ahụ kwuru na nwa ahụ zuuru ego n’akpa ya mana ya amaghị ihe banyere n’ime ya nke tinyere ya n’inye ya ụdị mmerụ ahụ dị otu ahụ. Nwaanyị ahụ gara n’ihu kọwaa na ya dị na mmbụ elekọta nwa ahụ na ejima ya, na ihe mere ụbọchị ahụ bụ akaọrụ ekwensu.”

  Oyeyemi kọwakwara na nnyocha e mere gbara ama na nna nwa ahụ e jiri agụba merụ ahụ gbahapụrụ ha na nne ya na ụmụnne ya nke mere ka nne ya na-agazi ụmụ obere ọrụ iji nwe ike lekọta ụmụ ya atọ. Ụmụaka ahụ na-anọ n’ụlọ onye agbataobi ha dịka ọ na-elekọta ha anya nke ọma nke na nne ha kwuru na ọ gbagwojuru ya anya ihe o mere nwa ya n’ihi na ọ na-emeso ya nke ọma na mbụ.

  Otu o sila dị, o kwuru na a kpọgala nwa ahụ ụlọgwụ ebe ọ na-anara ọgwgwa ma na-agbekekwa.

  Ka ọ dị ugbua, Kọmishọna uweojii steeti ahụ, Maazị Lanre Bankola enyela iwu ka a hafee nwaanyị ahụ n’aka ndị ọ dị n’aka, Anti Human Trafficking and Child Labour nke State Criminal Investigation and Intelligence Department (SCIID), maka ezi nnyocha na ịkpọpụ ya ụlọikpe.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here