Fada Oraemesi ga-eme ncheta ọgbụgba afọ iri asatọ n’afọ iri ise o chiri ụkọchukwu, ụbọchị ụka

0
6
Oraemesi

ỤBỌCHỊ ụka ọnwa Oktoba ga-adị n’abalị iri atọ na otu ka a ga-eme emume icheta afọ iri ise (Golden Jubilee) nke Fada Ọkammụta John Chukwuma Oraemesi ji chie ụkọchukwu, tinyere emume afọ iri asatọ ọ nọrọla n’elu ụwa.

  Oke mmemme a ga-ewere ọnọdụ n’ụlọụka St Gabriel’s Catholic Church, Okpuno n’okpuru ọchịchị Awka South na steeti Anambra. A ga-eji aja maasị elekere iteghete na ọkara (9:30 am) were malite.

  Onye ga-abụ onyeisioche bụ Ọkammụta Fidelis Okafor jibu ọkwa dịka onyeisi ụlọakwụkwọ Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu University (COOU); ebe onyeisioche nke abụọ ga-abụ Ọkammụta Can. Nwankwo nke Nnamdi Azikiwe University, Awka. Onye ga-abụ nna ụbọchị ahụ bụ Ọkammụta Ellis Idimobi bụ osote onyeisi ụlọakwụkwọ COOU.

Osote onyeisi kansụl parish St Gabriel, Sir Walter Umeukeji so wee tinye aka n’ozi n’aha ụkọchukwu parish na ndị niile na-aga ụka na St Gabriel’s Parish, Okpuno.

GUO:  Fada Oraemesi agbaala afọ iri asatọ, mee ncheta afọ iri ise o jiri chie ụkọchukwu

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here