Ị kwalite asụsụ, omenala Igbo n’ụlọ akwụkwọ

0
8

ASỤSỤ na omenala ka e ji ama obodo ọbụla nakwa ụmụ afọ obodo ahụ. Ndị ọbụla na- asụ otu asụsụ ma nwee otu omenala na emekọ ihe ọnụ. Ọ bụ nke a mere ndị Igbo ọbụla maara ihe jiri na eti mkpu ka anyị nile bụ ndị Igbo were asụsụ anyị kpọrọ ihe maka na okwu Igbo kwuru na onye gba nkịtị, ndị iro ewere ọba ya kpoo ntụ. Kedu ka anyị nile bụ ndị Igbo ga-esi nye aka ka asụsụ na omenala anyị ghara ịda ma ọ bụ nwụọ?

  Ọlụ a dị mkpa ga-amalite na ezinaụlọ ọbụla. N’ezie, ị bata na ezinaụlọ ụfọdụ, ha adịghị asụ Igbo n’ụlọ ha ma nne, nna na ụmụaka ha bụ oyibo ka ha na- asụ. Ụfọdụ n’ime ndị na-eme ihe ndị a bụ ndị a mụrụ n’ime obodo. Ha gụsịa akwụkwọ ma ọ bụ ha baa n’azụmahịa ma ọ bụ ọlụ na obodo ọzọ na-asụ asụsụ na abụrọ nke ha, ha echezọọ asụsụ ha. Ndị bi na mgbago ugwu na-asụzị asụsụ ebe ahụ. Otu a ka ọ dị ndị Igbo bi na mkpaghara ọzọ dị iche iche n’ala anyị. Dịka ha na-echezọ asụsụ ka ha na echezọ omenala Igbo. Ha a na-emezi ka ndị ahụ ha bi na be ha.

 Ụfọdụ n’ime ndị nne na nna na-edeba aha ha na mpaghara ha nọ n’ime ya na-asị na ebe onye bi ka ọ na-awachi. Okwesiri ka ndị Igbo nile, ebe onye anọna, ka osonyere na mkpu gọvanọ Anambra n’eti maka ‘Akulueụnọ’ maka na agbanyeghị otu onye Igbo ọbụla sị sonyere ndị ebe ọbụla o bi, nsogbu ọbụla dapụta, ndị ebe ahụ a gaghị arapụ ya maka na o so ha eme omenala ha ma ọ bụ n’asụ asụsụ ha nke ọma, kama ọ bụ ndị dị otua ka ndị isi ekwe ọnwụ nọ n’obodo ahụ na eburu ụzọ gbuo ma mebiee ihe ha ji biri na ebe ahụ.

  Ọ bụkwa n’ihi ihe ndapụta a ka ejiri na-asi ka ndị Igbo chọọ otu a ga-esi mee ka asụsụ na omenala  Igbo bụrụ ihe a ga-akpọchigha azụ malite na ezinaụlọ ruo  na ụlọakwụkwọ nile, ọkachasị ndị nke na-agụ akwụkwọ n’ala Igbo. Ndị nne na nna nakwa ndị nkuzi kwesirị ịnyere obodo anyị aka ka asụsụ na omenala anyị ghara ịnwụ ma ọ bụ daa.

  Otu onye nkuzi aha ya bụ Josephine Odi, bụ onye biara ezumike n’ebe di ya bi n’Ifite Awka kwuru ihe ndị a n’ụfọdụ ajụjụ ajụrụ ya maka okwu a akpụ n’ọnụ. O kwuru na ọdị ọtụtụ ụzọ a ga-esi kwalitekwa asụsụ na omenala. “Nke mbụ bụ site n’ezinaụlọ ọbụla. Nne na nna ọbụla ga-eme ka ụmụ ha mara uru ọ bara na ha bụ ndị Igbo. Ndị Igbo ga-akụziri ụmụ ha omenala ha, ejiji ha, nke ga-eme ka ụmụ anyị na etolite etolite hụ uru ọ bara na ihere agaghị na-eme ha mgbe ha n’asụ asụsụ ha.

  Onye nkuzi a bụ onye isi ụlọakwụkwọ Obochiri Primary School, Okposi, Ohaozara, nke dị n’Ebonyi Steeti kwuru n’oge ugbua, n’onye na-asụ Igbo mgbe nile, a na-ahụ agwa ya ka onye esoghị biri.  Ọ rịọrịọ ka ndị nne na nna mee ka ụmụ ha nwee mmasi n’asụsụ Igbo, ị mụta ide na ịgụ ya ebe ọbụla ha nọ.

  O kwuru na  nwa Igbo ọbụla ga- ama na-asụ oyibo mana asụ Igbo, a na-akụzi ya ugboro atọ n’izu ọbụla.

  Mgbe a jụrụ ya ma ụmụakwụkwọ ọ na etinye uchu ma a na-akụzi Igbo, okwuru sị na ụmụakwụkwọ adịghị etinye uchu otu o kwesiri maka n’ụfọdụ na-asị n’asụsụ Igbo na-afịa arụ na odide. Nke ọzọ bụ na ndị nkuzi ụfọdụ amaghị akuzi Igbo, nke so eme n’asụsụ Igbo na-anachigha azụ.

  O jikwa ohere a rịọ ka gọọmentị ala Igbo nile leba anya na ọnọdụ a, ka ha na ahaziri ndị nkuzi n’ala Igbo nkuzi ọzụzụ n’asụsụ Igbo. Ọ gara n’ihu sị na ndị Igbo  na-enwekarị mmasị n’omenala ndị ọzọ. O kwuru na ị bịa ebe a na-eme mmemme n’ala Igbo,nke  ọ bụkwa ndị Igbo nọ ebe ahụ, ha a na-asụ oyibo. Onye ọbụla chọrọ ịbụ nwa onye ọcha. Ọbụnadị nri e jiri mara ndị Igbo, ọdịghịzị onye na achọ iri ya.

N’ihe mere ụfọdụ ndị nkuzi ji eji asụsụ oyibo akuzi Igbo, ọ siri na ọ bụ maka na ha amaghị agụ ma ọ bụ ede Igbo nke ọma, ha ruo ebe ọgadoro ha, ha ewere asụsụ Ioyibo mezu ya. Onye nkuzi amaghị Igbo agaghị akụziri ụmụakwụkwọ ya Igbo nke ọma.

 Ọ gara n’iru kwusie ike na ụmụakwụkwọ adịzịghị enwe mmasị n’Igbo maka n’onwee onye nkuzi maara Igbo chọrọ ịkụziri ha Igbo, ha a na-eme mkpọtu ka onye nkuzi ahụ pụọ ka onye ọzọ bata.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here