Igwe mmadụ iwe na-ewe etigbuola onye uweojii gbagburu nwa afọ ise na Cameroon

0
8

 NDỊ mmadụ akatọọla agwa onye uweojii kpara na Cameroon site n’ịgbagbu nwatakịrị nwaanyị gbara afọ ise.

  Enondiale Tchuengia Carolaise ka a gbagburu ka ọkwọ ụgbọala bụ ha aga akwụkwọ jụrụ ịkwụsị n’ebe ndị uweojii na-anọ eme nnyocha n’ụzọ (checkpoint). Ndị nọ n’ụgbọala ahụ gụnyere nwata ahụ tufuru ndụ ya, ụmụaka abụọ ọzọ, nne ya na ọkwọ ụgbọala ahụ. Onyeuweojii ahụ ka e kwuru na ọ gbakanyere egbe n’ụgbọala ahụ, ma si otu ahụ gbagbuo Carolaise.

  Dịka akụkọ siri kọ, ha na-anaba ndị mmadụ ngarị n’ebe nnyocha okporo ụzọ na Cameroon. Eleghị anya na ọ bụ  ego ‘500 Central African CFA francs’ ka onyeuweojii ahụ chọrọ ịnapụta ọkwọụgbọala ahụ.

  Otu o sila dị, igwe mmadụ iwe na-ewe gbakọtara ebe ahụ ozigbo jide onye uweojii ahụ, tigbuo ya, ọ ghọọ ozu n’egbughị oge ọbụla.

  Otu o sila dị, e mechara n’ikpeazụ lie ozu Carolaise ụbọchị ahụ.

  N’ihi ọnọdụ ahụ, ndịisi na-ahụ maka nchekwa na mba ahụ, (Cameroon’s Ministry of Defense), akatọọla agwa onyeuweojii ahụ dịka nke jọgburu onwe ya dịka ha katọkwara agwa onye ọkwọụgbọala.

  N’okwu nke ya, bishọp nke Buea bụ Most Rev Micheal Bibi gakwara n’ihu katọọ otu onyeuweojii siri gbagbuo nwatakịrị nwaanyị ahụ tinyere ntigbu ndị mmadụ tigburu onye uweojii ahụ.

  O kwuru sị: “Ana m etinye olu m na nke ọtụtụ ndị ọzọ banyere otu e siri gba egbe n’ụgbọala nke butere ọnwụ nwatakịrị aka ya dị ọcha, sọọsọ maka na ọkwọụgbọala asọpụrụghi iwu ndị ọrụ nchekwa okporoụzọ. Ana m akatọkwa ogbugbu igwe mmadụ iwe na-ewe gburu onye uweojii gbara egbe ahụ n’ihi na onweghị onye nwere ikike iwepụ ndụ mmadụ.

  Ọ na-emetụta m bụ mwute ezinaụlọ Carolaise lara mmụọ, tinyere ndị ọzọ tufugoro ndụ ndị ha hụrụ n’anya n’ụdị ọnọdụ ahụ. Ana m akasi ezinaụlọ ndị ahụ niile o metụtara obi ma na-akpọku unu niile ka unu na-ekpere ndị nwụrụ anwụ ekpere.”

  Ya mere, Bishọp Bibi gara n’ihu kọwaa na ụka oge niile na-akwado ikike nke ịdị ndụ n’ebe mmadụ niile nọ, bụ nke o kwuru na o sitere n’okike e kere onye ọbụla dị ndụ n’oyiyi nke Chineke (Gen 1:27).

  Otu o sila dị, ọ gwara ndị ọrụnchekwa ka ha hie asaa n’anya iji gbanarị ihe ga-ewetara ndị mmadụ aka ha dị ọcha nsogbu dịka ọ gara n’ihu kwuo sị: “Ka anyị na-aga n’ihu na-ekpe ekpere maka ikpemkwumọtọ, udo na ịdịnotu n’ala anyị.”

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here