Ihe m gabigara n’aka ndị ntọrị – Fada Okoye

0
5

FADA Cornelius Okoye, ụkọchukwu parish nke St Theresa’s Catholic Church, Agulu nke dị n’okpuru ọchịchị Anaocha na steeti Anambra ekwuputala ihe ọ gabigara n’aka ndị Fulani na-achị ehi.

  Ya bụ ihe nke mere n’Oji River, na steeti Enugu dị egwu, bụ nke so n’otu mkpamkpa ndị omekome na-akpa na mpaghara Southeast. Ọ bụ ka Fada Okoye si njem mgbasa ozioma (crusade) ọ gara na St Michaels Parish Ugwuoba alọta ka ya bụ ihe mere n’elekere asatọ nke abalị.

  Dịka o siri kwu, ndị ahụ malitere gbawa ụgbọala ya egbe aghara aghara, ma jiri ngwa ọgụ dị iche iche wakpo ya ma kpọrọ ya baa n’ime oke ọhịa ebe ha nọrọ kechie ya anya.

  Ọ gara n’ihu kọwakwaa na ha gbara mbọ iji mma ‘daga’ gbawaa ya obi tupu egbe igwe na amụma mmiri a gbaa nke mere ka ha wara ọsọ.

  Fada Okoye kwuru sị: “Anyị si njem mgbasa ozioma alọta, ma dịka anyị na-achọ igarute àkwà mmiri Amansea, ebidoro m nụba ụda egbe ma bụrụ nke ha na-agba n’ụgbọala m. Ndị Fulani dị ihe dịka asaa n’ọnụọgụ, ji egbe AK47. Ebu m Sakaramenti dị Ngozi, Jesu nọ n’oke mwute (agonising Jesus), n’ụgbọala m. Adị m nkwadebe nke ọma (well equipped), maka ndị kwere. Ha nọ na-agba egbe na-aga n’ihu, ma na-abịa n’ebe m nọ. Emeghere m ụzọ ụgbọala, ma dabanye n’ime ọwa mmiri ebe apịtị nọ wee jide m. Apịtị ahụ jidere m ruo n’afọ. Ihe dịka mmadụ ise n’ime ha ji ọsọ gbata ebe ahụ ma dọpụta m. Ha kpọrọ m gaa n’ime oke ọhịa, tie m, kụọ m egbe ha, osisi na mma ‘daga’.

GUO:  Ejidela nwata nwaanyị dị afọ iri na asatọ tọọrọ onwe ya

  Agwara m ha na abụ m ụkọchukwu Osebuluwa. Nke ahụ kpasuru ha iwe. Otu n’ime ha sụrụ n’asụsụ ha ‘Dan kpuru ubanka’. Ha gbara m ọtọ, nibe m n’ala, kechie m ihu, imi na ọnụ. Achọpụtara m na ana m agafezi agafe. Anaghịzị m ahụ onwe m ka onye ka nọ ndụ n’elu ụwa a n’ihi na ọbara na-agba m n’ụzọ dị egwu.”

  Fada ahụ gara n’ihu kwuo na ya nyere ha ego ma ha jụrụ ajụ ma gwa ya na ha achọghị ego ya. O kwuru na ọbara gbara ya dị egwu nke na ọsụsọọ na-agwuzi n’ahụ ya. Na dịka nke ahụ na-eme na ihe ya na-ahụzi bụ ihe na-acha ọcha (whitish space), dịka ya na-anwụzi anwụ. O kwuru na ya malitere kpebe ekpere n’ime obi ya.

  Dịka Fada Okoye siri kwu, ha ji daga bewaa ya ahụ, ma chọọ ka ha bepuo obi ya tupu egbe igwe na amụma mmiri agbaa, ha wee wara ọsọ.

  O kwuru sị: “Ozigbo ahụ, anụrụ m olu gwara m sị,’ kulite gbaa ọsọ.’ Chukwu nyere m ike m ji gba ọsọ. Ha chụrụ m ọsọ ma bido na-agba m egbe.

  Ọ bụ ìhè (light) si n’egbe ha na-agba m ka m ji na-ahụ ụzọ. Ọ bụghị ya agara m ịdabanye n’ime ọdọ mmiri (lake) Amansea.”

  Otu o sila dị, ọ kọwara na ya gbarutere ebe ya nwetara enyemaka, onye ahụ kpọpụtara ya n’ụzọawaraawara tupu ndị ọrụ nchekwa ogbe (vigilate) enyezie aka were buga ya ụlọọgwụ ebe ọ nọzi mechaa wee nweta onwe ya ma chọpụta na ya nọ n’ụlọọgwụ.

  N’akụkụ nke ya banyere ya bụ ihe, bishọp ụka Katọlik dayọsis Awka bụ Most Rev. Paulinus Ezeokafor keleere Chineke maka ịzọpụta ndụ ụkọchukwu ahụ.

GUO:  Ndị NYSC ndị ntọ tọ̀ọ̀rọ̀ ènwéréla onwe ha

  O kwuru sị: “Ana m ekele Chineke n’ime ihe niile na fada ka dị ndụ ma na-eku uma, maka na ọ bụrụ na ị nụ ihe ọ gabigara ị ga- aghọta na ọ bụ aka ọrụ Chineke n’ezie. Chineke haziri ihe niile nke mere na e mechara, ọ gbalapụ. Ihe niile mere dịka ọrụebube, ọ bụrụ na ọ bụghị ebere Chineke, dayọsis Awka gaara atufu ndụ ụkọchukwu ọzọ.”

  Ọ gara n’ihu taa gọọmenti ụta banyere ọnọdụ enweghị ezi nchekwa cheere ala anyị aka mgba. Ya mere, ọ kpọkuru ya ka o lebaa anya nke ọma n’ihe banyere nchekwa maka ọdị mma ndị ọ na-achị, ma gwakwa ndị mmadụ ka uche ha dị n’ọnọdụ nchekwa ma na-amata ihe banyere gburugburu ha nọ na ya.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here