Na Niger, ndị mụ ụmụakwụkwọ 13 onyenkuzi bu nje HIV dinara akpọọla oku maka ikpemkwụmọtọ

0
10
Galadima

NNE na nna ụmụakwụkwọ ahụ dị iri na atọ n’ọnụọgụ bụ ndị onyenkuzi, Mohammed Galadima bu nje HIV metọrọ na Karanbande nke dị n’okpuru ọchịchị Borgu na steeti Niger, a kpọọla oku ka e nye onyenkuzi ahụ ntaramahụhụ dị egwu, iji dọọ ndị ọzọ aka na ntị.

  Ha kwuru sị: “Ọ na-ewute anyị otu onyenkuzi ahụ siri metọ obere ụmụaka anyị. Anyị na-arịọ ka e nye ya ntaramahụhụ dị egwu iji dọọ ndị ọzọ ga-achọ ịkpa ụdị arụ ahụ aka na nti, ọ bụghị so na steeti ahụ kama n’ala anyị niile gbaa gburugburu, aka na ntị.”

  Otu n’ime ndị nne na nna ahụ, Idris Haruna, bụ onye odozi ụgbọala kwara arịrị ihe onyenkuzi ahụ mere nwa ya nwaanyị gbara afọ ise ma kwuo na sọọsọ ma e nyere Galadima ntaramahụhụ zuru oke na ya agaghị enwe obi ańụrị.

  Nwoke ahụ mụtara ụmụ isii kọwara na ya amaghị banyere ọnọdụ ahụ wee ganye na nwa ya nwaanyị agwa nne ya ihe onyenkuzi ahụ mere ya, nke mere ka o mee ka ya mata.

  O kwuru sị: “N’echi ya, agbara m gaa n’ụlọakwụkwọ ahụ nye mkpesa ma ha gwara m lawa na e mechaa na m ga-enweta ozi ha. N’ikpeazụ, ha kpọrọ m ka m bịa n’ụlọakwụkwọ. Oge m ruru ebe ahụ, ezutere m nne na nna ndị ọzọ bụ ndị bịara ọ bụghị sọọsọ maka ime mkpesa kama ka a kpọpụtara ha onyenkuzi ahụ ka ha nyụọ ya ịkpakwụ.”

  Dịka onye nna ọzọ aha ya bụ Gambo siri kwụ: “Ọ bụrụ na ọ bụghị na ha mere ngwangwa kpọga ya Minna, ezinaụlọ ụmụaka o metọrọ gaara eji iwe kugbuo ya, ọ ghọọ onye nwụrụ anwụ.”

  Otu o sila dị, ọ gara n’ihu kwuo na ihe ha na-arịọzi bụ ka e kpee ikpemkwumọtọ ma nye ya ntaramahụhụ iji gbochie ụdị ihe ahụ ime ọzọ.

  Ka anyị cheta na ihe dịka izuụka atọ gara aga, na State Criminal Investgation and Intelligence Department (SCID) kpụpụrụ Galadima nnukwu ụlọikpe Majie, na Minna.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here