Nri ndị Igbo: Achịcha ede

0
8

NDỊ Igbo nwere ihe oriri dị iche. Nke kachasi bụ na ihe oriri ọ bụla nwere mgbe e jị erikarị ya. Anyị ga-eleba anya n’ihe oriri bụ achịcha ede. Otu e si akwadobe ya, nakwa otu e si esi ya. Ọdịkwa ụzọ atọ e si esi achịcha ede.

  Nke mbụ, ikpata achịcha ị ga esi, ị suo ya n’ikwe ọ dị kirikiri, ịbanye ya mmiri, o mee ihe dịka awa abụọ ị gụpụ ya na mmiri ahụ gbanyekwa ya mmiri ọzọ, ọ dịkwa awa abụọ ọzọ igbanye ya mmiri. Ibeta akwụkwọ unere ma ọ bụ akwụkwọ jioko ị ńaa ya n’ọkụ.

  Ị gụpụ achịcha ahụ na mmiri, were akwụkwọ unere ahụ kechie ya sinye ya n’ọkụ. Ị ga-esi ya ogologo oge tutu o ghee. Imechasia akidi, afufa wunye ha n’otu ite ahụ. o ghee ịgụpụ achịcha tupu iwunye ya na nkata e ji awụpụ ihe. I gbanye mmanụ n’ite, ọ di obere ọkụ iwunye yabaasi, o ghee iwunye achịcha, akidi, afufa, ukpaka, ose na nnu, ịgwọkọ ya o buru oriri.

  Nke abụọ,ọ bụrụ na ị chọrọ iji fịọfịọ sie achichaede ị ga ebu ụzọ sinye fịofịọ, isie ya ihe dịka awa abụọ ikechie achịcha ahụ tinye n’ime ite fịọfịọ ahụ ị na-esi. I ga esi ya ogologo oge ka o wee ghee. Marakwa na ọ bụrụ na o gheghị eghe nke ọma ọ gaghị enye gị ihe ị chọrọ. I sichaa ya, ịtọpụ achịcha ahụ n’akwụkwọ unere ahụ wunye ya na nkata ka o wee gụpụ mmiri. Itinye mmanụ n’ite ọ dị obere ọkụ iwunye yabaasi, o ghee iwunye achịcha ede ahụ, tinye ụkpaka, nnu, ose, ịgwọkọọ ya ọ bụrụ oriri.

GUO:  Nri ndị Igbo: Ofe ọgbọnọ

  Nke atọ, ọ bụrụ na ị chọrọ iji akwụkwọ nri dịka ụgụ, inine, akwụkwọ ụgbọgụrụ sie achịcha, nke a bụ otu ị ga-esi sie ya. I sichaa achịcha, i wupu ya na nkata ka ọ gụpụ mmiri, ị itinyekwa mmanụ n’ite, ọ dị ọkụ i wunye yabaasi, o ghee obere i wunye akwụkwọ nri nke ị chọrọ iji sie, i wunyezie achịcha ede ahụ itinye ose, nnu na ụkpaka ma ị chọọ i gwọkọzie ya ọ bụrụ oriri.

  Ihe dị mma n’ihe oriri a bụ achịcha ede bụ na ọdịghị enye nsogbu n’afọ, ọ bụkwa nri ọ ga-abụ ị rie ị chọkwaa ka ị rie ya ọzọ.   

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here