Ọrụaka dị iche iche e ji mara ndị Igbo (I)

0
8

AGBỤRỤ niile nọ n’ụwa nwere ọrụaka e jiri mara ha. Ya mere, ndị Igbo nwere ndị nke e jiri mara ha.

  Ọrụaka e jiri mara ndị Igbo gụnyere, ịkpụ ụzụ, ọrụugbo, ịkpa nkata, ite nkwụ, ịkpụ ite, ịtụ ikwe na odo, igbu ichi, ide uri w.d.g.

  Ọrụaka ndịa kachara pụta ihe n’oge gboo. N’oge ahụ, nwoke ọ bụla ruru ihe e ji nwoke eme ga-enwerịrị ọrụaka e jiri mara ya, nke o ji elekọta ezinaụlọ ya. Ihe ndị a na-apụta ihe nke na o nwee ihe onye chọrọ ọ gaba na be onye na-emepụta ihe ahụ.

  Obodo ọ bụla nwere ọrụaka e jiri mara ha. Iji ma atụ, e kwuo maka ịkpụ ụzụ a kpọọ Awka n’ihi na ọ bi njirimara ha. Otu o sila dị, nke ahụ apụtaghị na ọ bụ sọ Awka na-akpụ ụzụ n’ala lgbo. O nwere otu ogbe dị n’Isuofia n’okpuru ọchịchị Aguata na steeti Anambra. Ebe m na-ekwu banyere ya bụ Akulu Isuofia, e jiri ịkpụ ụzụ mara ha n’ihi na n’oge mbụ ezinaụlọ niile dị n’Akulu Isuofia nwere ndị na-akpụ ụzụ.

  Ịkpụ ụzụ bara nnukwu uru n’ihi na esi na ya arụpụta ihe dị iche iche e ji igwe ememepụta dịka, egbe, mma, osiite, ọgụ, ọnya w.d.g. Ọtụtụ ndị mmadụ nwetere ọrụ site n’ire ihe ndị a kpụtara n’ụzụ.

  N’otu aka ahụ, ọrụugbo bakwara uru n’ihi na a na-esi na ya akọpụta erimeri dịka ji, ede, ọka, akịdị, akpụ na ọtụtụ erimeri ndị ọzọ. Ndị ji ọrụugbo mere ọrụaka anaghị anọ n’ihe ụkọ n’ihi na ha na-enwe nri mgbe niile ma na-enwetekwa ego site n’ire ihe ndị ha nwetere n’ugbo.

 Ndị na-azụ anụmanụ sokwa na ndị ji ọrụugbo mere ọrụaka. Anụmanụ bara nnukwu uru n’ihi na a na-ata a ụ ha ata ma na-erekwa ha na-ahịa wee si otu ahụ na-enwete ego. Anụmanụ ndị Igbo na-azụ gụnyere ehi, ewu, atụrụ, ọkụkọ, ezi, nkịta.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here