Abada: Akwa agbụrụ niile na-eyi

0
5
Abada a kpọbara n'ahịa, onye na-akwa ya, tinyere nke a kwara akwa

ABADA bụ akwa ewu na ọkụkọ na-eyi. Ma nwoke ma nwaanyị, ma okenye ma ụmụaka ji abada ekwe oyooyoo.

  Abada dịbara gboo, ọ maliteghị taa. Ọ bụ akwa e ji eme emume ma bụrụkwa akwa e nwere ike iyi oge ọ bụla. N’ihi na ọ na-adị onye ọ bụla mma, ọ na-agba ọnụ ka akara ọkụ.

  Abada na-adị n’ụdị dị iche iche, otu ahụ ka ọnụ ahịa ha di dịrị iche iche, nke onye chọrọ, o goro. Ụdị ọ bụla onye chọrọ dị n’ahịa, a na-achọ ha mma n’ụdị dị iche iche.

  Ndị mmadụ ji abada eme akwa njiri mara(uniform). Nke bụ na ị hụ ka ha yi ya n’igwe ị mara ndị ha bụ. N’ihi na ụfọdụ abada na-enwe aha ndị mmadụ na-eji aha amata abada nke ha chọrọ. Ọmụmaatụ: ndịnkuzi ji abada aha ya bụ mkpụrụọka wee mere akwa njiri mara ha. Otu ahụ ka ọ dị ebe otu dị iche iche ndị ọzọ nọ. Aha ndị ọzọ a na-akpọ ụfọdụ abada gụnyere: kpakpando, kịrịkịrị staa, kpọtụba, obidiya, oche eze, gbọlọdị, fan, w.d.g.

  Ka ọ dị ugbu a, ndị mmadụ jizi abada eme akwa njiri mara nke a na-akpọ ‘asoebi’ ma ha na-eme nnukwu mmemme dịka, ịgba nkwụ nwaanyị, ọṅụ nwa, akwamozu w.d g. N’ihi nke a, ịbata ebe a na-eme mmemme, ebe niile abụrụ sọ mma dịka ndị mmadụ yi ụdịrị abada dị iche iche, nọrọ n’otu ha (groups).

  Abada bụ ihe ekike zuru ụwa ọnụ. Ka ọ dị ugbu a, ọ na-agazi ahịa n’ike n’ike karịa ka ọ dị na mbụ, ma nke bụ eziokwu bụ na abada na-aga ahịa kemgbe ụwa bidoro.

GUO:  Abada, akwa agbụrụ niile na-eyi

  E wepụkwa na e ji ya eke ekike, abada bụ otu ụzọ mmadụ si akpata ego.  

  Ọtụtụ ndị mmadụ, ma nwoke ma nwaanyị ejirila ịzụ ahịa abada rụọ ụlọ, lụọ nwaanyị ma zụọ ụmụ ha na mahadum, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Ya mere, ndị mmadụ na-eji ire abada mere aka ọrụ ma si n’ụzọ dị otu ahụ nwee ezi obibi ndụ.

  N’oge gboo, mgbe elu bụ ala ọsa, ndị na-azụ ahịa abada dị olemole, ma taa ụgbọgụrụ na-amịzi ojoroko maka ewu na ọkụkọ na-azụzi ahịa abada n’ihe na onweghị onye ihe ọma na-asọ nsọ.

 Otu onye kwuru sị: “Abada bụ ezigbo ihe na ndụ ndị mmadụ. Abada bụ akwa a na-eyi n’ahụ mana ihe o jiri bụrụ ọ pụrụ iche bụ na ọ na-adị n’ụdị dị iche iche nke mere na ma ogbenye ma ọgaranya na-egote ya. Ọtụtụ ndị mmadụ ejirila abada baa ọgaranya dị egwu, ya mere ana m akpọku ndịntorọbịa enweghị ọrụ ka ha bagide ire abada. Iwu abụghị na onye ahụ ga-enwe ọdụ ahịa n’ihi na e nwere ike ire abada ebe ọbụla dịka n’ụlọ obibi mmadụ, n’ụlọọrụ oge e nwere ohere maka ezumike wdg. Mmadụ na-esite n’ụzọ dị otu a malite ndụ tupu o nwezie ọdụ ahịa.”

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here