Egwu ndị Igbo: Egwu e ji eze mmiri

0
8
Ndị na-eze mmiri na-agụ egwu

DỊKA a na-akụ ka ekwe oge niile, ndị Igbo bụ agbụrụ ji ihe ọbụla na-eme na ndụ ha agụ egwu.Ya mere, mgbe ọbụla mmiri na-ezo, onye ọbụla na-agba ọsọ mmiri site n’ịgbaba n’ụlọ maọbụ n’akụkụ ụlọ ebe ọ ga-anọ zere mmiri. N’ọnọdụ dị otu ahụ, ndị Igbo na-agụ egwu were na-eche ka mmiri bie maọbụ gbachaa. Ma mgbe ha nọ n’ọrụ ma mgbe ha nọ n’ụlọ,ndị Igbo na-eji ịgụ egwu were eze mmiri,ọ bụladị ụmụakwụkwọ nọ n’ụlọakwụkwọ mgbe mmiri na-ezo.

  Egwu e ji eze mmiri na-atọ ụtọ nke ukwu ọ kachasị mgbe a nọ n’usekwu na-ahụ ọka na-eru ube, oriri a na-aga. N’oge dị otu ahụ, ọ na-adị ka mmiri hapụ izocha ezocha maka na ọnọdụ dị otu ahụ na-enye obi ụtọ.

Ọmmụatụ egwu e ji eze mmiri bụ:

Mmiri ……..zobee zobee

Anwụ ………mụbaa mụjie chi

Agaghị m aba n’ụlọ onye kpọrọ m asị.

GUO:  Egwu ndị Igbo: Egwu Ụka (Gospel Music)

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here