Gọvanọ ehibela otu ga-enyocha ọdịdị ụlọelu okpukpu 21 na Lagos

0
6
Ulọelu ahụ dara ada

 E BUPUTALA ozu ndị mmadụ tinyere ndị merụrụ ahụ site n’ụlọelu okpukpu iri abụọ na otu (21 storey building) nke dara n’Ikoyi Lagos.

  Ya bụ ụlọelu nke kacha to ogologo n’okirikiri ebe ọ dị dara n’ihe dịka elekere abụọ nke ehihie na Monde; ebe ndị ọrụ ụlọ nọ n’ime ya.

  Otu onye nọ ka o mere kwuru sị: “Anyị chọpụtara na ndị nọ n’okpukpu nke ikpeazụ, yaabụ n’elu elu tọkịịrị n’ime ya dịka igwe na enye ọkụ na njini a ga-eji kwobie igwe (iron rod) ha tọkịịrị n’ime ya arụghị ọrụ n’oge.”

  Otu o sila dị, ndị ọrụ nzọpụta mgbe ọ dị ngwangwa si Lagos State Emergency Management Agency (LASEMA), Lagos State Building Control Agency (LASBCA), tinyere ndịuweojii na ndị ọzọ kpara ike dị egwu site n’irigo elu ebe ahụ ụlọ dara iji zọpụta ndị tọkịịrị n’ime ya.

  Osote gọvanọ na-achị steeti Lagos, Dọkịnta Obafemi Hamzat, onye duuru ndị ọrụ gbatagbata gaa ebe ahụ kwara arịrị banyere ọnọdụ agbasoghị iwu (Physical Planning Law), nke ndị na-arụ ụlọ na-eme na steeti ahụ.

  Hamzat kwere ndị mmadụ nkwa na gọọmenti ga-anwa oke ya ime ihe o kwesịrị ka o mee n’ọnọdụ ahụ.

  N’akụkụ nke ya, otu onye ọrụ gọọmenti Lagos gwara ndị ntaakụkọ na ndị gbatara ọsọ enyemaka gbara oke mbọ ịzọpụta ndị mmadụ.

  Ọ gara n’ihu kọwaa na onye na-arụ ụlọelu ahụ Gerrad Terraces, Fourscore Limited nwetere ikike ịrụ ụlọelu okpukpu iri na ise (15), ma mechaa kpebie n’onwe ya ịrụ ya okpukpu iri abụọ na otu.

  Dịka o siri kwu, na kọmịshọna na-ahụ maka mmepe obodo ‘Physical Planning and Urban Development’, Dọkịnta Idris Salako adịla na mbụ nwụchikọọ onye na-arụ ụlọelu ahụ ma ọ gara n’ihu na-arụ ụlọ ahụ n’enweghụ nkwado gọọmenti.

  A kọwakwara na ụlọọrụ ji ọrụ iwulite ụlọelu ahụ, seere aka n’ọnwa Febụwarị afọ gara aga.

  N’okwu nke ya, onye ọzọ ọkwa ya gbagotara na gọọmenti steeti ahụ kwuru sị na ụlọọrụ ahụ ji ọrụ emeghị ka ndị ọ dị n’aka mata na ha eserela aka ha amaghị maka nke ahụ tutu ọdachị ahụ adapụta.

  Gbasara ya bụ ihe, onye jibu ọkwa dịka onyeisi Nigeria Institute of Building (NIOB), Adekunle Awobodu, kwuru na ọ dị mwute ịhụ ọdịda nke nnukwu ụlọ ahụ n’ebe dịka Ikoyi. O kwuru na o kwesịghị ka ndị odoghị anya na-arụ ụlọelu nwere ọtụtụ okpukpu, na o kwesịrị ka ọ bụrụ ndị maara ihe ekwe na-akụ n’ọrụ ụlọ ga-ahụ maka ya.

  Dịka ọ na-eti aka n’obi maka ndị tụfuru ndụ ha, o kwuru na ndị na-arụ ụlọ kwesịrị ihi asaa n’anya ka ụdị ọdachị ahụ ghara ịdapụta ọzọ.

  Otu o sila dị, aka na-achị steeti Lagos bụ Gọvanọ Babajide Sanwo-Olu enyela iwu ka e mee nnyocha banyere ọdịda ụlọelu ahụ dara. Kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi, Gbenga Omotoso onye nke kụpụrụ ozi ahụ kpọrọ oku ka ebe niile dere duu.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here