Ihe karịrị ndị ntaakụkọ 1200 ka e gburu n’ihu ọrụ site 2006 ruo 2020 – UNESCO

0
8

United Nations EducationaL, Scientific and Cultural Organisation (UNESCO) e kwuputala na ihe karịrị ndị ntaakụkọ dị otu puku na narị abụọ (1200) ka e gburu maka ịrụ ọrụ ha site n’agbata afọ 2006 ruo 2020. UN kọwara n’afọ 2020 na ihe karịrị mmadụ iri isii na abụọ tụfụkwara ndụ ha tinyekwara na iteghete n’ime iri ka ndị gburu ha na-aga n’enwe taghị ntaramahụhụ.

  N’afọ 2021, n’ihi ngụkọ ihe ndị a, International Day to End Impurity for Crimes against Journalists na-ekwuwapụta banyere ikpemwkwụmọtọ n’ọnọdụ ahụ.

  N’ozi ya nke ọ kpụrụ na Tuzdee, odeakwụkwọ zuzugbe (UN Secretary General), Antonio Guterres rụtụrụ aka na ọtụtụ ndị ntaakụkọ atụfuola ndụ ha dịka ha na-arụ ọrụ n’ebe e nwere nsogbu tinyere na ọnụọgụ ndị e gburu ebe enweghị esemokwu agbagoola na nsonso a.

  O kwuru sị: “N’ọtụtụ obodo (countries), sọọsọ inyocha wuruwuru, ịtụ mgbere mmadụ, ndị na-emebi ikike mmadụ nwere maọbụ ihe gbasara gburugburu na-etinye ndụ ndịntaakụkọ na nsogbu.”

  Ndịntaakụkọ na-agabigakwa ọtụtụ ihe ịmaaka gụnyere ntọrị, mmekpa ahụ (torture), na ntụkpu.

  Ọ rụtụrụ aka na arụ a na-eme iji megide ndịntaakụkọ nwere ihe ịma aka n’ebe ọha nae ze gba gburugburu nọ n’ihi na ọ na-egbochi ndị mmadụ inweta ozi.

  O kwukwara na ndịntaakụkọ ụmụnwaanyị na-enwekwa ihe iche aka mgba nke ha. Akwụkwọ sitere na UNESCO nsonso a kwuru na pesentị 73 n’ime ha kwuru na e meela ha akaje dị iche iche na mgbasaozi ọgbara ọhụrụ ‘online’ n’ihi ọrụ ha.

  Ode akwụkwọ zuzugbe ahụ kpọrọ oku ka e nye ndịntaakụkọ nkwado n’ụwa niile. Onyeisi (Director-General UNESCO, Audrey Azuolay kwukwara na ikwu eziokwu na-etinye ọtụtụ ndịntaakụkọ na nsogbu. O kwukwara na ndị ọrụ na-ahụ maka iwu na nchekwa na-agharịpụ ndị mmadụ mgbe ọbụla e nyeghị ntaramahụhụ n’ebe onye wakporo ndịntaakụkọ nọ.

  Ya mere o kwuru na obodo nwere ọrụ dịịrị ha n’ichekwaba ndị ntaakụkọ ma hụ na ndị kpara arụ megide ha, alapụghị n’enwetaghị ntaramahụhụ; dịka ọ rụtụrụ aka na ndị ọkaiwu (judges) na ndị okpe ikpe (prosecutors) nwere ezi ọrụ ha ga-arụ banyere ọnọdụ ahụ.

  N’afọ ole na ole, nsonso a UNESCO azụpụtala ndị ọrụ ‘judicial officials’ gụnyere ndị ọka ikpe (judges), okpe ikpe (prosecutors) na ndị ọka iwu (lawyers) chọrọ iri puku iri abụọ na atọ (23,000) n’ọnụọgụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here