Iji ụgbọala eme njem aga obodo tere aka n’abali

0
9
Ndị na-eme njem abalị

Echiche ndị mmadụ maka ya

IJI ụgbọala eme njem aga obodo tere aka bụ otu ụzọ ndị mmadụ si abagide njem. N’ihi otu ihe siri gbata kwụrụ n’oge ugbu a, ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu ihe dị iche iche gbasara ọnọdụ ahụ. Otu o sila dị, Igbo kwuru okwu sị na uche onye anaghị adị ya njọ, ya mere onye ọbụla nwere ihe na-amasị ya na ndụ; nke na-amasị m nwere ike ọnaghị amasị gị. O were bụrụ ya, ọtụtụ ndị mmadụ tinyere ọnụ na ya bụ okwu, otu a ka o siri ga:

Onwuka Mark:- Ihe dị n’iji ụgbọala eme njem gaa obodo tere aka bụ ọchịchọ nke onwe. Ụfọdụ ndị mmadụ na-akatọ ya ma mụ onwe m chọrọ ya achọ. Agụrụ m mahadum ma rụkwaa ọrụ n’ugwu Awusa, ọ bụ ụgbọ abalị ka m ji eje eje ma na-alọta ala Igbo.

Ịgba ụgbọ abalị dị nnọọ ka iji otu okwute tugbuo nnụnnụ abụọ, iji maa atụ, ọ bụrụ na ị hapụ Onitsha n’elekere isii nke uhuruchi ụtụtụ echi tupu elekere asatọ nke ụtụtụ I ruola Kaduna. Ọ bụrụ onye jere ozi maọbụ ihe dịka azumahịa o were ụbọchị ahụ mee ihe ọ gara ime, banyekwa ụgbọ abalị laghachi ebe o siri bịa.

Ọzọ dị ka ibe ya bụ na anaghị enwekebe ihe mberede okporoụzọ n’ụgbọ abalị n’ihi na ọ bụ ụgbọala olemole na-abagide njem abalị. Ọ naghị ekwo ekwo nke e mere mgbe chi dị. Njem na-aga werewere, o nweghị ihe dịka ụgbọala ịkpụ ka ejula (hold up) nke na-eme ka ndị njem tọkịrị ebe ha na-eme njem. Nsogbu a mgbe ụfọdụ na-eme ka chi jibido ndị njem n’ụzọ.

GUO:  Njem abalị ajọka makaihe mberede okporoụzọ – Onyeisi FRSC

  Ụfọdụ ndị na-aga ugwu Awụsa na-anọ awa abụọ n’Obollo. Ma n’ime ihe niile ihe nwere uru nwekwara ọghọm. Ihe iche aka mgba a na-ahụta na njem abalị bụ ndị ohi.

  Onwere otu oge anyị zutere ndị ohi na njem abalị, n’ihi na ọ bụ oge abalị ka ha ji enuputa n’okporoụzọ. Ha na-anọkarị n’okporoụzọ karịa ka ha si anọ oge chi dị. N’ihi ọnọdụ a ka ndị ọrụ nchekwa ji ama ọkwa banyere ọghọ m dị na njem abalị.

Ngozi Nnabuife:- Njem abalị na-amasị m nke ukwuu. M banye n’ụgbọala n’abalị na-aga steeti Benue bụ ebe m na-agakarị m rahụ ụra ozigbo. Aga m arahụgide ụra wee ruo ebe ahụ. Ọ bụ ahịa ka m na-aga azụta na Zakibiam. M ruo, m zụọ ahịa n’ike n’ike bakwaa ụgbọ abalị lọghachite. M gawa, ana m aba ụgbọala n’Onitsha, anyị lọtaba onye ọbụla apụọ ebe ọ chọrọ ịpụ.

Elo John:- Ababeghị m ụgbọ abalị kemgbe m jiri bụrụ mmadụ. Enweghị m mmasị ịba ụgbọ abalị n’ihi na anaghị ahụta ya dịka ihe dị mma.

  Otu oge m nọgidere na njem were ruo abalị bụ n’ihi nsogbu ụzọ agaghị aga n’ihi ụgbọala ịkpụ akpụ. Ụbọchị ahụ, ihe mere m jiri nọgide n’ụgbọala bụ n’ihi na erutebela m ebe m na-aga, ma ọ bụghị ya agara m arịtụ chọọ ụlọoriri na ọńụńụ m ga-alaba na ya.

Izuchukwu Okafor:- Ụgbọ abalị dị mma dịkwa njọ. Otu ọghọ m dị ya bụ na ọkwọụgbọala bụ mmadụ, ụra nwere ike iburu ya n’ihi na abalị bụ oge e ji arahụ ụra. Chineke kere ụwa ekeghị abalị ka ọ bụrụ oge e ji amụ anya.

  Ya mere, n’ihi nke ahụ ihe mberede okporoụzọ nwere ike dapụta. O meela ọtụtụ oge. Ọzọ bụ na ndị ohi na-awakpokari ndị njem n’oge abalị, ndị ntọrị na-emekarịkwa n’oge ahụ, tinyere na ọ bụrụ na ihe mberede dapụta anaghị enwetakarị ndị enyemaka.

GUO:  Njem abalị ajọka makaihe mberede okporoụzọ – Onyeisi FRSC

  N’ime ihe niike n’ihi na ihe ndị ahụ dapụtara n’abalị ndị mmadụ ma ndị ọrụnchekwa na-adị ụkọ. Ma ọdachị ndị ahụ dapụta n’oge ehihie a na-enwetakarị enyemaka, ọ bụrụ ihe dịka na ihe mberede okporoụzọ mere n’oge ehihie a na-eji ọsọ zọọ ndụ ndị mmadụ, ma ọ dịghị otu ahụ n’oge chi ka dị. Ọzọ bụ na o nwee ka ọrịa si daa onye na-eme njem n’abalị. Ọ na-esi ike ịhụ ebe e gotere ọgwụ iji ọzọ ndụ onye ahụ ma ọ bụrụ oge chi dị a ga-enweta ọtụtụ ebe a ga-azụta ọgwụ tinyere ndị ga-enye aka kwuo ụlọọgwụ dị nso. Ihe iche aka mgba ọzọ a na-ahụta na njem abalị bụ na ọ bụrụ na ụgbọala emebie n’ụzọ onweghị ebe a na-ahụ onye na-edozie ya ma ya fọdụzie ebe a ga-egota akọrọngwa e ji edozi ụgbọala.

  Nke a meela ka ndị njem rahụ n’ụzọ ugboro ugboro. Ọtụtụ n’ime ha esila na ya zute ihe ike dị iche iche n’ihi na oge ụfọdụ ọ na-emebi n’ọma agụ, ebe ụlọ adịghị nso.

Ada Uzo:- Ọ bụ eziokwu na ihe nwere uru nwere ọghọm, ma nke bụ eziokwu bụ na ọghọ m dị na njem abalị karịrị uru dị na ya. Njem kacha mma ma e mee ya mgbe chi dị, ihe ọ bụla na-emenu, ị na-ahụ ya. Ndị ohi nọrọ n’ụzọ, ọ bụrụ oge chi ka dị e nwere ike hụta ha ma ọ bụ si n’ụzọ dị ańaa chọpụta ma ọ bụrụ n’abalị oge ụfọdụ ọkwọụgbọala na-agbakwuru ndị ohi n’ike.

Ihe mmadụ ga-ahụ ma gbafere n’oge chi ka dị na-ahịa ahụ ime ya n’abalị. Ọtụtụ ihe mberede a na-enwe n’abalị anaghị enwe ya n’oge ehihie, ọmụmaatụ, ihe dịka ebe ụzọ jọrọ njọ, olulu dịgasị, ọkwọụgbọala na-ezetenwu ya mgbe chi dị ma ọdịghị otu ahụ n’oge abalị.

GUO:  Njem abalị ajọka makaihe mberede okporoụzọ – Onyeisi FRSC

  Ụgbọala nwere ike dachie ụzọ, ọkwọụgbọala agaghị achọpụta n’oge, n’ihi ya ọ bụrụ ụgbọala ọ na-anya gbakwuru nke ahụ dachịrị ụzọ, n’oge dị otu ahụ, ọ bụrụ na ihe mberede akpọtụọla. Ọzọ bụ na ọtụtụ ụgbọala anaghị enwe ọkụ dịka o kwesịrị. Nsogbu ọkụ ụgbọala emeeka ka e nwee ihe mberede ọkpọrọụzọ ọtụtụ oge nke na-ebutekarị ịtufu ndụ na mmerụ ahụ n’ebe ọ dị ukwuu. Ndị ohi na-ezukarị ibu mmadụ na njem abalị. Ụfọdụ ka ha na-efe ihe ụra eburu ha, site n’ụzọ dị otu ahụ ha ezuo ha ohi.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here