Na Delta, ndị oji egbe egbuola pastọ RCCG

0
6
Pastọ Yerindibe lara mmụọ

NDỊ oji egbe amaghị ndị ha bụ agbagbuola otu pastọ nke ụlọụka Redeemed Christian Church of God (RCCG), Silvester Yerinbide. Ya bụ ọdachi dapụtara n’okirikiri Aladja dị n’okpuru ọchịchị Udu na steeti Delta.

  Ka anyị cheta na onye hibere RCCG bụ pastọ Enoch Adeboye.

  Dịka e siri kwu, pastọ ahụ lara mmụọ si n’agbataobi ahụ, Ogbe-Ijoh nke dị n’okpuru ọchịchị Warri Southwest, na steeti ahụ.

  Yerinbide ka e kwuru na a wakporo ya ebe ọ na-aga ekpere abalị (vigil) na Nadja. Dịka nke ahụ mechara, ndị ji ọgbatumtum bụgara ya otu ụlọọgwụ dị n’ogbe ahụ, ma e mechara nwụọ n’ihi mmerụ ahụ o nwetara na nwakpo ahụ.

  Ndị Ijaw Youth Council (IYC) n’Ogbe-Ijoh na-akọwa na ndị gburu onyisi ụka ahụ si Aladja dịka Yerinbide kọwara site n’ákwá ọnwụ ya na ndị ahụ wakporo ya na-asụ asụsụ Urhobo.

  N’akụkụ nke ya, onyisi Aladja, Otto Ogbiruveta gọrọ agụgọ na ndị gburu pastọ ahụ esighị n’ogbe ya ma kwukwaa na a na-amazi imi n’ala iji chọpụta otu mmiri siri baa opi ụgbọgụrụ.

  Ogbe abụọ ahụ sere okwu n’oge gara aga ma gọọmenti steeti ahụ mere ka udo dị ihe dịka afọ abụọ gara aga. Otu o sila dị, a na-akọwa na ọ dịka ha na-achọkwa ịmalite esemokwu ọzọ.

GUO:  Oke mmiri ozuzo achụpụla ihe karịrị otu puku mmadụ n'ụlọ na Delta

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here