Ndị nche Amotekun ejidela ndị jere ohi n’ụlọ akụ WEMA n’Okuku

0
7
Ndị ohi ahụ e jidere, na ihe ha jigasị arụ ọrụ

IHE ọ sọrọ mkpụrụ ji ya zobe n’ime ala, e mechaa onye nwe ubi ga-ahụrịrị ya anya. Ọ hụghị ya na ndụ, ọ hụ ya n’ọnwụ.

  N’ịgbaso nke a, ndị ọrụ nchekwa Amotekun anwụchikọọla mmadụ abụọ a na-enyo ènyò na ha soro wee gaa ohi ahụ dara ụda e zuru na ngalaba ụlọakụ ‘Wema Bank’ dị n’Okuku, n’okpuruọchịchị ime obodo Odo-Otin nke steeti Osun.

  Ndị ahụ e jidere gụnyere Maazị Kehinde Babalola (gbara ahọ iri abụọ na atọ) na Maazị Timileyin Afolabi (gbara ahọ iri na iteghete, ma bụrụkwa ndị a nwụchikọrọ ụbọchị Tuzdee oge ha na-achọ izu ohi ọzọ n’obodo ahụ.

  Ọ bụ oge a na-agba ya ajụjụọnụ ka Maazị Kehinde Babalola, onye bụ onye Ogbomoso jiri ọnụ ya wee sàá asịsà na ọ bụ ya duru ndị òtù ohi ahụ bịara wakpòrò ndị òtù ohi ahụ bịara wakpò ụlọakụ Wema Bank na mgbe gara aga.

  O jikwara ọnụ ya wee sàá asịsà na ọ gaala ohi n’ọtụtụ ebe dị icheiche n’oge mbụ, ma n’Ibadan, ma na mpaghara Ile-Ife, ma na-eyikwa ụmụakwụkwọ égwù na mpaghara mahadum steeti Osun, bụ ‘Osun State University’ (ngalaba nke Okuku).

  Onye òtù ya, bụ Maazị Timileyin Afolabi kwuru na ya bụ onye obodo Ado-Ekiti nke steeti Ekiti kwukwara na o teela o siri zube ohi, n’agbànyèghị na ọ bụ obere nwa. O mekwara ka a mara na e nwere ụfọdụ ndị mmadụ ha na ha so were ezu ohi ahụ, bụkwazị ndị nọ n’ọsọ ugbua.

  Ihe dị icheiche e nwetere n’aka ndị ahụ gụnyere egbe, ọtụtụ mgbọ egbe nà ụdị mma na obere ngwaọrụ ndị ọzọ dị icheiche ha ji aga ọrụ. E nyefèzịkwara ndị ahụ n’aka ndị ọrụ ‘Department of State Services (DSS), maka imekwu nnyocha miri èmì banyere ha na arụrụala ha.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here