Ndị ntorobia na-ede akwụkwọ n’Anambra akpọtụrụla ANPC, nye ha asambodo ekele

0
9
Ndị òtù ahụ oge ha na-enye Maazị Nnabuife (nke mbụ n'aka ekpe) asambodo ahụ n'ụlọọrụ ya

OTU jikọtara ndị ntorọbịa na-ede akwụkwọ na steeti Anambra a maara dịka ‘Society of Young Nigerian Writers (SYNW)’ ngalaba Anambra ebuterela ụlọọrụ ‘Anambra Newspapers And Printing Corporation (ANPC)’, ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa, SportslightXTRA na Homeland, na onyeisi ụlọọrụ ahụ bụ Sir Chuka Nnabuife ụkpa ekele maka nkwado dị ukwuu nke ha na-enye ha n’ịchịkọba mmemme ‘Chinua Achebe Literary Festival and Memorial Lecture’ kemgbe ọtụtụ afọ.

  Ndị otu ahụ kwuputara ekele ahụ oge ha bịara njem mkpọtụrụ n’ogige isi ụlọọrụ ahụ nke dị n’Awka, hụ isi obodo steeti Anambra.

  N’okwu ya na njem mkpọtụrụ ahụ, onyeisi otu ahụ, Maazị Izunna Okafor kwuru na ebumnobi njem ahụ bụ iji kelee Onyeisi ụlọọrụ ahụ nà ụlọọrụ ahụ n’onwe ya, maka nkwado ha na-enye ha oge niile iji na-achịkọba emume ahụ afọ ọbụla, ya na ịgwa ha na mmemme ahụ nke afọ a erukwaala, tinyekwara ịrịọ Onyeisi ụlọọrụ ahụ ka ọ bụrụ onye ga-enye nkuzi ‘Chinua Achebe Memorial Lecture’ n’emume nke afọ a.

  O kwuru sị: “Anyị na-ekele ụnụ maka ndị nke ụnụ mere n’oge gara aga, ma na-arịọkwa nkwado, ndụmọdụ na enyemka ụnụ n’emume nke afọ a.”

  Oge ha kparịtachara banyere okwu ahụ a kpụ n’ọnụ n’iji na-akwadebe emume nke afọ a, ndị òtù ahụ nyèrè Onyeisi ụlọọrụ ahụ tinyere ụlọọrụ ahụ bụ ANPC n’onwe ya asambodo ekele (Certificates of Appreciation).

  Na nzaghachi, Maazị Nnabuife kelere ha maka ịkwanyere ya ugwu ma nyekwa ya ohere ịbụ onye ga-enye nkụzi n’emume ahụ agba nke isii ya, ma bụrụ nke ọ nabatara ma kwe nkwa ime ka ọ daa ụda. Ọ sị: “Ana m enwe ezi mmasị mụ na ụnụ ịnọkọ, ọ bụ ya kpatara na ụnụ ga na-ahụ m oge niile ụnụ na-akwado emume ụnụ.”

GUO:  N'Anambra, ndị omenka emegheela ihe ngosi nke 2020

  Dịka ọ na-egosịpụta afọojuju o nwere n’ebe Ọkammụta Chinua Achebe nọ, bụ ode akwụkwọ a maara aha ya ma bụrụkwa onye e ji maka ya were achịkọba emume ahụ, o kwuru sị: “Achebe bụ ọ̀kàibè n’edemede; mana n’ebe m nọ, ọ bụ otu n’ime ndị odeakwụkwọ kacha dị ukwu n’ime ndị niile bierela n’ụwa, n’ihi na ọ maara ka e si ahazi edemede, ma bụrụkwa onye na-agbọ ihe ewu na-eri.”

  Ya mere, o kwezị̀rị̀ ndị òtù ahụ nkwà ezi nkwado ya tinyere nke ụlọọrụ ahụ oge niile.

  Ndị otu ahụ sonyere na njem ahụ gụnyere: Franklin Ifeanyi Diala, Valentine Muoma na John Gloria Oluchi.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here