NDLEA ejidela nwaanyị na-enye nwa ara buru ọgwụike na ndị ọzọ

0
7
Ndị ahụ e jidere maka ọgwụike na ihe dị iche iche e nwekọtasịrị n'aka ha

IGBO sị na ọnwụ ga-egbu nwankịta anaghị ekwe ya nụ isi nsị.

  Ka ọ dị taa, ndị ụlọọrụ ahụ na-ebu agha megide ịkpọ, ịñụ, ire maọbụ ịtụ mgbere ọgwụike n’ala Nigeria, bụ ụlọọrụ ‘National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA)’ anwụchikọọla otu nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ maka itinye aka n’ọgwụike.

  Nwaanyị ahụ aha ya bụ Mariam Adetilewa Dirisu ka e kwuru na ọ gbara ahọ iri atọ na ise, ebe nwa ya ka dịkwa naanị ọnwa abụọ; ma bụrụkwa onye e kwuru na e jidebụọla na steeti Edo n’abalị iri abụọ na otu nke ọnwa Ọktooba ahọ a oge ọ chọrọ isi na nzuzo wee nye onye nọ n’ụlọ mkpọrọ n’ụlọọrụ NDLEA ụtara akpụ e tinyere ọgwụike n’ime ya.

  Kaosiladị, e mechaara gbapụta ya bụ nwaanyị ka ọ labagodi, dịka onyeisi ụlọọrụ NDLEA, bụ Mohamed Buba Marwa siri nye ntụziaka, maka ihi obere nwa ya ọ mụrụ ọhụrụ; mana ọnwụ ahụ ná-achụgharị ya bụ nwankịta ekweghị ya nụ isi nsị, nke mezịrị na ọ gakwara n’ihu na-etinye aka n’ihe gbasaara ọgwụike, tupu e wee nwụchikọkwa ya ọzọ maka ịtụ mgbere ọgwụike Skunk arọ ya ruru kilogram ise, nà ọgwụike Molly arọ ya ruru kilogram asatọ na ụma ofu.

  Nwaanyị ahụ, onye kwuru na ọ bụ nwata akwụkwọ ngụchara na Mahadum Benin, kà e kwuru na ọ tụrụ ahịa ọgwụike ahụ ka e si Legọọsị buteere ya, tupu e wee nwụchikọọ ya.

  Dịka ozi a kụpụrụ site n’aka onye na-ahụ maka mgbasaozi n’isi ụlọọrụ NDLEA dị n’Abụja, bụ Maazị Femi Babafemi siri kọwaa, ọ bụ nwaanyị ahụ na mmadụ abụọ ndị ọzọ (bụ ụmụnwoke na-ekwu na ha bụ ndị ọrụ nchekwa) ka aka kpaara maka ọgwụike ahụ, ma bụrụkwa ndị e nwetara ọgwụike mgbakọta ike arọ ya ruru otu puku, narị asaa na iri isii na iteghete site n’aka ha na ụfọdụ ndị ọzọ. Mmadụ abụọ ahụ sị na ha bụ ndị ọrụ nchekwa gụnyere Umah Ibrahim na Sadiq Abubakar, ya na onye òtù ha bụ Maazị Auwal Hassan.

GUO:  NDLEA akatọọla ụmụnwaanyị ịńụ mmiri ihe nsọ ha

  O kwukwara na ndị ọrụ NDLEA gbachibidokwara ọgwụike Cocaine, Heroin, Methamphetamine Cannabis n’ọdụ ụgbọelu ‘Murtala Muhammed International Airport, MMIA’ dị na steeti Lagos, bụ nke a na-achọ ibupù mba London. Ọ kọwara na ọ bụ oge a na-eme nnyòcha ahụ a na-emekarị tupu ụgbọelu apụọ njem ka a chọpụtazịrị ọgwụike ahụ, bụ nke e zogasịrị n’ime igbe/katọn ncha Zee na ncha Dudu-Osun.

  O kwukwazịrị na ha nwụchikọrọ ụfọdụ ndị ọzọ na-etinye aka n’ọgwụike na mpaghara ebe ndị ọzọ dị icheiche n’ala Nigeria, nke gụnyere Ondo, Kogi, Lagos, Delta.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here