Ọrụaka dị iche iche e jiri mara ndị Igbo (II)

0
7

ỊKPA nkata so n’ọrụaka e jiri mara ndị Igbo. N’oge gboo, ọtụtụ ndị mmadụ si n’ịkpa nkata mepụta ihe a hụrụ anya.

  Nkata bara nnukwu uru n’ụwa. Ọ bụ ya ka e ji ebu ibu dị iche iche dịka tomato, ose, yabaasị,abacha, ọkwụrụ w.d.g. Ka a na-ekwu maka nkata ka a na-ekwu maka ihe ndị ọzọ a na-akpa akpa dịka akpara, nkucha, ute, atanị na ndị ọzọ.

  Akpara bara nnukwu uru n’akụkụ nke ya. E ji ya eme ihe dị iche iche. E ji ya agbakpọ ihe n’anwụ, e ji ya afọ onugbu tinyere ihe ndị ọzọ. Nkucha ma ọ bụ nkufe bụ ihe e ji achụ ekpomokụ, e jikwa ya ekunwu ọkụ ka nkụ wee nwuo. Ute nọ ka akwa e ji edina ala. E ji ya arahụ ụra ma jirikwa ya na-ezu ike. Ute bụ ihe ndị Igbo ji edina ala site n’oge gboo. Na mbụ, e ji ute ekpuchi ọnụụzọ ọ kachasị n’abalị mgbe a na-arahụ ụra.

  Ihe ọzọ ndị Igbo na-akpa bụ atanị mana ụfọdụ na-akpọ ya ịdụ atanị, ọzọ dịka ya bụ ayo, n’ime ihe niile ha so n’ọrụaka ndị Igbo na-arụ. Atanị na ayo bụ ihe ndị Igbo ji ekpuchi ụlọ ka gbamgbam. Dịka e si enweta ekwere nke eji akpa nkata site na nkwụ, ọ bụ na ngwọ ka e si enweta atanị, ma ayo bụ ahịhịa a na-enweta n’ọhịa. Ọ bụladị n’oge ugbu a, a ka ji ha ekpuchi elu ụlọ dịka n’ọdụ ahịa, n’ogige ụlọ oriri na ọṅụṅụ ebe ndị mmadụ na-anọ ezu ike n’hi na ha na-ajụ ahụ oyi.

  E wepụ ihe ndị a, ndị Igbo nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ ha ji aka akpa nke gụnyere okpu, akpa, ihe a na-anya n’olu tinyere ihe ịdị ọzọ eji achọ mma.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here