Ụbọchị ndị ọrụ oyibo: Obiano etòóla ndị ọrụ Anambra, gwa ha tụnyere Soludo

0
7
Obiano (n'ihu) oge ọ na-agwa ndị bịara mmemme ahụ okwu n'Awka

A KPỌKUOLA ma dụọ ndị ọrụ oyibo steeti Anambra ka ha kwàdo ma tụnyere nwa amadi ahụ ji aha otu ndọrọndọrọ ọchịchị ‘All Progressive Grand Alliance (APGA)’ were apụta ịzọ ọkwa Gọvanọ na nhọpụta ahụ a ga-eme n’abalị isii nke ọnwa Nọvemba a, bụ Ọkammụta Chukwuma Soludo.

  Aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ bụ ya kpọrọ òkù a na mmemme ụbọchị ndị ọrụ oyibo nke ahọ 2021, bụkwa nke weere ọnọdụ n’isi ụlọọrụ oyibo steeti ahụ dị n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra.

  N’okwu ya n’ebe ahụ, Gọvanọ Obianọ kelere ndị ọrụ oyibo ahụ maka etu ha siri wee kwàdo ma na-adọnyere ọchịchị ya ukwu kemgbe ahọ asaa gara aga ọ batara n’ọkwa ọchịchị, wee ruo ugbua ọrụ ya dịka Gọvanọ steeti ahụ na-abịazị na njedobe.

  Ọ gbara akaebe na ezi ọrụ ha na arụ nà nkwado ha na-enye ọchịchị ya so n’isi sekpụ ntị n’ihe ọchịchị ya jiri magbuo onwe ya, bụkwazị nke mere o jiri kwe ha ọtụtụ nkwa dị icheiche ma mezuputachakwa ha niile, ọkachasị dịka o siri metụta ihe gbasaara ịkwalite ọnọdụ obibindụ ha, ịhụ na a na-akwụ ha ụgwọ ọnwa na ego ndị ọzọ ruru ha n’oge kwesiri ekwesi, tinyere ụzọ ndị ọzọ o sigoro mete ha mma kemgbe ihe karịrị ahọ asaa gara ọ nọ n’ọkwa.

  Ọ kpọkukwazịrị ha ka ha kwàdo Ọkammụta Soludo dịka onye ga-anọchị anya ya, n’ihi na ọ hụtala ya dịka onye tozuru òkè, onye ma nke ekwe na-akụ, nà onye nwere ihe a chọrọ iji wee malite ebe ya onwe ya kwụsịrị, wee bulie steeti ahụ n’ogoogo dị elu, ma jikwaa akụnụba steeti ahụ nke ọma, dịka o siri kwesi.

GUO:  Obianọ agaala njem nleta n'ogige ụlọ ezumeezu mba ụwa a na-arụ n'Anambra

  Gọvanọ Obianọ nọkwazịrị n’ebe ahụ wee kwuwaa na ọrụ agaghị adị ụbọchị Tọzdee na Fraịdee, ka onye ọrụ oyibo ọbụla wee nwee ike ịla na mpaghara obodo ha dị icheiche ga tụọ akwụkwọ.

  N’okwu nke ya n’ebe ahụ, onyeisi ọrụ oyibo na steeti Anambra, bụ Ọkaiwu Harry Udu kwuru na Gọvanọ Obianọ gosipụtarannọọ na ọ bụ enyì ndị ọrụ oyibo na onye metụtara ndị ọrụ oyibo steeti ahụ na-echu ụra n’ime ihe karịrị ahọ asaa ọchịchị ya nọgoro na steeti ahụ.

  Ọ kpọpụtasịrị ụzọ dị icheiche ya bụ Gọvanọ sigoro mete ndị ọrụ oyibo steeti ahụ mma, ọkachasị site n’ịkwụchapụ ha ụgwọ dị icheiche e ji ha n’oge mbụ kemgbe ọtụtụ ahọ, na-akwụ ha ụgwọ etu na mgbe o kwesiri, na-enye ha ọzụzụ na mgbe na mgbe, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ. O kwuputakwazịrị olileanya o nwere na onye ga-anọchi ya dịka Gọvanọ steeti ahụ ga-abụkwa onye ma nke ekwe na-akụ, onye ihe gbasaara ndị ọrụ oyibo na-echu ụra, na onye ga-emekwa nke ọma karịa ya.

  Na ntụnye nke ya, Ọkammụta Soludo kwere nkwà na ọ ga-ebido ebe Gọvanọ Obianọ kwụsịrị ma rụkwàsakwa na ntọala ahụ ọ tọgoro wee mee ndị ọrụ oyibo steeti ahụ mma karịa etu a tụrụ anya.

  O kwuru na ịkwalite ezi ọnọdụ obibindụ ndị ọrụ oyibo steeti ahụ ga-eso n’otu ihe gbara ọkpụrụkpụ ọchịchị ya ga-elebà anya ma ọ bụrụ Gọvanọ, n’ihi na ya onwe ya ghọtara ụdị uru ndị ọrụ oyibo bara na mmepe na ọganihu obodo maọbụ steeti ọbụla.

  Ọ kpọkuzịrị ndị ọrụ oyibo steeti ahụ ka ha pụta n’ìgwè ụbọchị Satọdee ma soro ibe ha tụọ akwụkwọ, n’ihi na ọdịnihu steeti ahụ dàbèèrè na mpụtara nhọpụta ọchịchị ahụ a ga-eme ụbọchị Satọdee.

GUO:  N'Anambra, otu onye atụfuola ndụ ya n'ihi nsogbu dapụtara n'etiti ndị ọna ụtụ na ndị na-anya ụgbọala

  Ndị ọzọ kwuru okwu na mmemme ahụ gụnyere onyeisi otu jikọtara ndị ọrụ oyibo lagoro ezumike nka nke ụlọọrụ ‘Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC)’, Maazị ABC Ubani; nwa amadi ahụ a mà ama na-eme ejije, bụ Maazị Chiwetalu Agụ; onyeisioche òtù jikọtara ndị isi ụlọakwụkwọ sekọndịrị na steeti ahụ, bụ ‘Anambra Confedration of Principals of Secondary Schools (ANCOPPS), Maazị Joevita Arazu, tinyere onyeisi ụlọọrụ ‘Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC)’, Maazị Chuka Nnabuife, bụkwa onye nyere Gọvanọ ụfọdụ akwụkwọ akụkọ dị icheiche ụlọọrụ ahụ bipụtara na nsonso a.

  Mmemme ahụ dọtàrà ndị imirikiti ndị ọrụ oyibo steeti ahụ, ndịisi ụlọọrụ dị icheiche, na ọtụtụ ndị ọzọ selitere isi na steeti ahụ. A nọkwazịrị n’ebe ahụ wee mee emume ịwa achịcha bekee maka óké ụbọchị ahụ, bụkwazị nke mere ka mmemme ahụ zaa aha a kpọrọ ya.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here