Achibishọp Martins etiela ndị ụlọelu dara na Lagos metụtara aka n’obi

0
7
Most Rev. Martins

BISHỌP ụka katọlik Lagos, Most Rev. Alfred Adewale Martins etierela Gọvanọ steeti Lagos, Maazị Babajide Sanwo-Olu na ndị ezinaụlọ niile tụfuru ndụ ndị nke ha mgbe ụlọelu okpukpu iri abụọ na otu ahụ dara n’Ikoyi Lagos, aka n’obi.

  N’ozi nke onyeisi mmekọrịta (Director of Social Communications) nke archdiocese ahụ, Fada Anthony Godonu tinyere aka na ya, Archbishop Martins gara n’ihu kasie ndị niile nwetara mmerụ ahụ n’ọdịda ụlọ ahụ dara. O kwuru na ọnọdụ ahụ bụ nke atụghị anya ya, tinyere ihe ndị yitere ya bụ ihe a kaara igbochinwu site n’ezi ọrụ na nlekọta site n’aka ndị ọ dị n’aka.

  Achibishọp ahụ kọwara ọdịda ụlọ na-ada na steeti Lagos ọtụtụ oge tinyere mpaghara ndị ọzọ n’ala anyị na nsonso a dịka oke ihe mmetụta ma kpọọ oku ezi nnyocha na nlekọta n’ebe ndị ọrụ (construction industry) nọ iji gbochie iji akọrọngwa adịgboroja tinyere arụghị ihe dịka o kwesịrị nke a na-ahụtaba n’ebe ụdị ọrụ ahụ dị.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here