Anambra 2021: Echiche ndị mmadụ banyere nturugo ahụ Soludo nwetara

0
7

KA ọ gachara awa olemole ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka nhọpụta ọchịchị n’ala Nigeria bụ Independent Electoral Commission (INEC) kpọpụtachara mputara nhọpụta ọchịchị ọkwa gọvanọ ahụ e mere na steeti Anambra ma kwuo na ọ bụ Ọkammụta Charles Chukwuma Soludo nwetara mmeri; ọtụtụ ndị mmadụ dị iche iche ekwuputala uche ha banyere mpụtara nhọpụta ọchịchị ahụ na nwa amadị ahụ tuuru ugo bụ Ọkammụta Soludo. Ụfọdụ ndị ahụ kwuputara uche ha na ihe ha kwuru gụnyere:

Mmeri Soludo bụ nke ndị Anambra– Obiano

AKA na-achị Anambra bụ Gọvanọ Willie Obiano ekwuputala na mpụtara nhọpụta ọkwa gọvanọ e mere gosipụtara ezi olile anya na mmalite ọhụrụ n’ebe ndị Anambra nọ. Gọvanọ Obiano kwuputara nke ahụ n’okwu ọ gwara ndị Anambra ụbọchị Wenezdee banyere nhọpụta ọchịchị ahụ site n’ụlọ ya n’Aguleri.

  Gọvanọ ahụ, onye kelere ndị Anambra maka ịgbaso ụzọ dị mma iji mee ka ugwu steeti anyị guzosie ike, dịka ọ rụtụrụ aka na mmeri ahụ bụ nke ndị Anambra, ọkachasị ụmụnwaanyị Ebenebe, na ndị otu APGA, bụ ndị jụrụ ego e nyere ha iji wee duhie ha ka ghara ịtụnyere otu ndọrọndọrọ APGA, ya na ndị Anambra bi mba ọzọ.

  Gọvanọ Obiano kwuru na gọvanọ ahụ a họpụtara ọhụrụ, Ọkammụta Chukwuma Soludo nwere ezi aha, nke ọ ga-echekwaba, tinyere na ọ ga-eme ka steeti ahụ nwee ọńụ.

  Ọ gara n’ihu kwuo na ha gbasapụrụ aka ịnabata ọtụtụ ndị mmadụ n’otu APGA, dịka ha ga-arụkọ ọrụ ọnụ n’iwulite obodo maka iganihu.

  Gọvanọ Obiano toro onyeisiala Mohammadu Buhari maka ịkwudosi ike n’okwu ya ma jirikwa ohere ahụ kelee onyeisioche APGA n’ala anyị bụ Ozomkpu Victor Oye, onye jibu ọkwa dịka onyeisioche otu ahụ Sinetọ Victor Umeh, ndị ndụ ụka, ndị eze ọdịnala, ndị ndụ obodo na ndị ọzọ ọnụ ruru n’okwu tinyere ndị ọrụ nchekwa.

Nhọpụta onye ọchịchị Anambra gara nke ọma – Buhari

ONYEISIALA Muhammadu Buhari akụpụrụla Ọkammụta Charles Chukwuma Soludo onye ji òtù ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressives Grand Alliance (APGA) wee zọọ ọkwa gọvanọ na steeti Anambra ozi ekele dịka o nwetachara mmeri.

  Onyeisiala toro ndị ọrụ nchekwa maka mbọ ha iji hụ na nhọpụta ọkwa ọchịchị ahụ gara nke ọma, ma tokwaa Independent National Electoral Commission (INEC) maka ezi nchịkọta nhọpụta ahụ n’agbanyegheghị ihe iche aka mgba e nwere na mbụ.

  Onyeisiala Buhari kpọkuru Soludo, bụ onye so n’òtù Presidential Economic Advisory Committee ka ha chịkọba ndị ọzọ ọnụ ruru n’okwu iji buso ihe iche aka mgba e nwere na steeti ahụ na South-East niile agha.

  Ya mere, onyeisiala nwere ezi olileanya na gọvanọ ahụ na-abata ịrụkọ ọrụ ọnụ maka udo, nchekwa na mmepe; ọ bụghị sọ na steeti Anambra, kama na ala anyị niile.

Soludo ga-emere Anambra karịa nke o mere na CBN – Oye

ONYEISIOCHE  otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressives Grand Alliance (APGA) n’ala anyị, Victor Oye, kwuru na onye tuuru ugo na nhọpụta ọkwa gọvanọ e mere na Nọvemba 6 na steeti Anambra, Ọkammụta Chukwuma Soludo ga-emekwa nke ọma dịka o mere na ụlọ ọbaego Central Bank of Nigeria ma e duchaa ya n’iyi ọrụ na Maachị 2022.

  N’okwu ọ gwara ndịntaakụkọ ozugbo Independent National Electoral Commission kwuputachara na ọ bụ Soludo tuuru ugo na nhọpụta ọkwa gọvanọ ahụ e mere n’Anambra, nke nwere okpuru ọchịchị iri abụọ na otu,  Onyeisioche APGA ahụ kwuru sị: “Nke a bụ mmeri maka onye kwuo uche ya, ọbụghị sọọsọ maka APGA kama maka ndị Nigeria niile n’ihi na INEC tuputara ezi usoro kwesịrị ntụkwasi obi. Akọrọngwa BVAS rụrụ ọrụ nke ọma, ya mere obi bụ ya ańụrị n’ihi na mbọ anyị gbara alaghị n’iyi.”

  Oye kọwara na Ọkammụta Soludo dịka onye bụ gọvanọ CBN site 2004 ruo 2009 bụ onye kacha tozuo oke na nhọpụta ọchịchị e mere.

  O kwuru sị: “Onye anyị wepụtara na nhọpụta ọchịchị e mere, Chukwuma Soludo kacha tozuo etozuo n’ebe onye ọbụla e nwere ike ịhọpụta nọ, ya mere, anyị nwere ntụkwasa obi na ọ ga-eme nke ọma ma mejupụta ihe a chọrọ n’ọchịchị onye kwuo uche ya n’ebe ndị be anyị nọ. Anyị chekwubere na ala Nigeria niile sonyeere anyị n’ańụrị.”

  Ọ gara n’ihu kọwaa na ndị mmadụ nwere ọtụtụ nchekwube na olile anya n’ebe Soludo nọ n’ihi na ha ma na ọ na-abịa ịgbanwo Anambra.

  Oye gakwara n’ihu kwuo na site na mmeri APGA meriri ọzọ n’Anambra na òtù ndọrọndọrọ ahụ ga-enwetakwa mmeri na steeti anọ ndị ọzọ dị na South-East.

  Ka ọ dị ugbua, steeti Imo na Ebonyi, bụ ndị otu ndọrọndọrọ All Progressives Congress (APC) na-achị, Abia na Enugu bụ Peoples Democratic Party (PDP) ebe Willie Obiano nke APGA bụ gọvanọ na-achị Anambra, ebe a na-atụ anya na ọ ga-ahafe ọchịchị n’aka Soludo na Maachị, 2020.

  Otu o sila dị, o kwuru na e nwere ezi olile anya na ha ga-enweta South-East niile n’ihi na n’Anambra, na ha egosipụtala ezi ọchịchị, tinyekwara na ha ga-agbatịpụkwa aka na steeti ndị ọzọ n’ala anyị.

  Oye gosipụtara ezi ntụkwasa obi na Soludo ga azọpụ ụkwụ dimkpa site n’ụbọchị mbụ ọ ga-amalite ọrụ, dịka o kwuru na ọ ga-emekwa dịka o mere na CBN.

  O kwuru sị: “Soludo ga-eji ihe ndị ọ maara mbụ doro ya anya nke ọma were bata bụkwa nke ga-agbanwe Anambra.

Mmeri Soludo bụ ihe ndị mmadụ chọrọ– Ortom

AKA na-achị steeti Benue, Gọvanọ Samuel Ortom ekeleela Ọkammụta Charles Soludo nke All Progressives Grand Alliance (APGA) maka nturu ugo ya na nhọpụta ọchịchị gọvanọ ahụ e mere.

  Ekele nturugo ahụ nke Ortom kụpụrụ bụ nke sitere n’aka odeakwụkwọ mgbasaozi nyegara gọvanọ, Nathaniel Ikyur.

  Dịka ozi ahụ siri kwu, gọvanọ ahụ kọwara nturu ugo Ọkammụta Soludo ka ezi ngosipụta ọchịchọ ndị mmadụ, steeti ahụ, na ọ bụghị site na wuruwuru.

  Gọvanọ Ortom toro njikere na mkpebi ndị Anambra site mmalite ịchụ nta nkwado (campaign) wee ganye na a kpọọ npụtara (result). Na ha eleghị anya n’azụ, wee mee ebumnuche ha site n’ịhọpụta onye bụ iche ha.

  Ọ gara n’ihu too ndị ọrụ nchekwa dị iche iche e zigara na steeti ahụ maka igbasoro usoro iwu, tupu a malite nhọpụta, tinyere mgbe a na-eme ya na mgbe e mechara ya n’enweghị nsogbu ọbụla.

  Gọvanọ ahụ tokwara ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (INEC), dịka o kwuru na ha gbọrọ ihe ewu na-eri. Na ha kpara ike dị egwu n’ịhazị nhọpụta ọchịchị ahụ n’ańaghị ntị na n’aka ndị si ebe ọzọ iji ghasaa ebumnuche ndị steeti Anambra.

  Ọ rụtụrụ aka na mputara nhọpụta ahụ e mere na steeti Anambra gosiri na ọchịchị onye kwuo uche ya ga-adịgide ma ndị niile ọ dị n’aka mee ihe dịka o kwesịrị n’usoro ọchịchị onye kwuo uche ya.

  Ya mere, Gọvanọ Ortom kpere ekpere na Chineke ga-echekwaba gọvanọ ahụ a chọpụtara na steeti Anambra iji mee ka ọ duo ndị nke ya nke ọma ka o were mejuputa uche ya maka steeti ahụ.

Mmeri Soludo bụ ndị mmadụ ịkwughachi APGA ụgwọ maka ezi ọchịchị – Umeh

ONYE jibu ọkwa dịka onyeisioche All Progressives Grand Alliance (APGA) ekwuola na mmeri Ọkammụta Chukwuma Soludo nwetara na nhọpụta ọchịchị gọvanọ e mere na steeti Anambra bụ ndị mmadụ ikwughachi otu ndọrọndọrọ ọchịchị APGA ụgwọ maka ezi ọchịchị.

  Umeh, onye so na ndị na-ekpọkọta vootu a tụrụ (collation agent) nke APGA gwara ndị ntaakụkọ okwu mgbe a kpọpụtachara Soludo dịka onye tuuru ugo na nhọpụta ọchịchị site n’ike Ọkammụta Florence Obi, bụ onye ji ọkwa dịka ‘returning officer’, n’isi ụlọọrụ Independent National Electoral Commission (INEC) Awka.

  Ume kwuru na APGA agbaarala ndị Anambra ezi mbọ kemgbe 2003, nke mere ha ji gaa n’ihu ịkwụghachị APGA ụgwọ mmeri, ọbụghị sọọsọ n’Anambra ma n’ala Nigeria gbaa gburugburu.

  Ọ kọwara nhọpụta ọchịchị ahụ dịka nke kacha mma n’ihe niile merela na Nigeria tinyere na APGA nwere afọ ojuju inweta mmeri n’ime okpuru ọchịchị iri na iteghete.

  Dịka o siri kwu, APGA gbadosiri mgbọrọgwụ ike n’Anambra, na onye ọbụla chere na ọ ga-aghasa ya ga-akwado nke ọma.

  Ọ gara n’ihu kwuo na mmeri nke Soludo meriri dị oke mkpa n’ebe APGA nọ, ma gosipụtakwa olile anya òtù ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ nwere ịgbasa na mpaghara Nigeria ndị ọzọ.

  Ọ gbara ama na Soludo dị njikere ịchị Anambra dịka ọ kọwara na ọ dịla na mbụ nwee usoro ọ haziri ọ ga-agbaso.

  Ọ kọwara Soludo dịka onye kacha n’ime ndị niile y ana ha gbakọrọ ọsọ ahụ, na ọ ga-achị dịka a tụrụ anya.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here