Anambra 2021: Soludo eturula ùgò

0
7
Onye ji aha otu ndọrọndọrọ ọchịchị APGA wee zọọ ọkwa gọvanọ ahụ, Ọkammụta Chukwuma Soludo (n'iru) na ndị nkwado ya, ka ha jupụtara n'ọnụ ngwangwa INEC kwuchara na ọ bụ ya tuuru ùgò

OKE itimkpu ọñụ dara n’ọnụ ụtụtụ ụbọchị Wenezdee, oge ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka nhọpụta ọchịchị, bụ ụlọọrụ ‘Independent National Electoral Commission (INEC)’ kwuwàrà ma kpọpụta Ọkammụta Charles Chukwuma Soludo dịka onye tuuru ùgò na nhọpụta ọchịchị ọkwa gọvanọ ahụ e mere na steeti Anamba na nsonso a.

  Ọ bụ onye ji ọkwa ‘Returning Officer’ maka nhọpụta ọchịchị ahụ ma bụrụkwa onyeisi Mahadum Calabar, bụ Ọkammụta Florence Obi kpọpụtara ya bụ mpụtara ikpeazụ nke nhọpụta ahụ n’isi ụlọọrụ INEC dị n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ.

  N’okwu ya oge ọ na-akpọpụta mpụtara ahụ n’Awka, ya bụ Ọkammụta, onye nyere nkọwa banyere etu ọnọdụ siri gbata kwụrụ na ya bụ nhọpụta, mèrè ka a mara na ọ bụ ụbọchị ụka ka a malitere kpọba mpụtara ntụliaka ahụ, mana a kpọruzịghị ya n’isi n’ihi na a tụghị akwụkwọ n’Ihiala, nke pụtara na atụmakwụkwọ ahụ ezughị òkè. Ọ bụ nke a mezịrị e jiri wee hibegharịa ụbọchị Tuzdee, abalị iteghete nke ọnwa Novemba dịka ụbọchị a ga-emegharị nhọpụta ọchịchị n’okpuruọchịchị ahụ.

  Ọ kpọpụtakwara mpụtara ole otu ndọrọndọrọ ọbụla nwetere na ntụliaka nke e mere ụbọchị Satọdee, ma kwukwazie na a ga-agbakwụnye ya mpụtàrà nke e nwetere na ntụliaka nke ahụ e mere n’Ihiala, iji wee nwete mkpokọta ọnụọgụgụ vootu niile a tụrụ, nà nke otu ndọrọndọrọ ọbụla nwetere, ka e wee mara onye na otu ndọrọndọrọ tuuru ugo na nhọpụta ahụ.

  Ka ọ gbakọchazịrị mpụtàrà ntụliaka niile ahụ, o kwuwara na ọ bụ Ọkammụta Soludo tùùrù ùgo, n’ihi na ọ bụ ya nwetara ọnụọgụgụ vootu kachasị n’ime vootu otu ndọrọndọrọ iri na asatọ sonyéré na ntụliaka ahụ nwètàrà. Dịka o siri kpọpụta, mkpokọta ọnụọgụgụ niile ahụ otu ndọrọndọrọ dị icheiche nwetara.

  Dịka o siri kpọpụta ya, mpụtara ikpeazụ na onụọgụgụ vootu otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọbụla na onye ọbụla soro wee zọọ ọkwa ahụ nwetere na ntụliaka ahụ bụ:

Godwin Maduka

(A)           —         2,054

GUO:  Buhari eturula ùgò ịchị Nigeria afọ anọ ọzọ

Ben Etiaba

(AA)       —         83

Chidozie Nwankwo

(AAC)            —   588

Akachukwu Nwankpo (ADC)    —   324

Afam Ume-Ezeoke

(ADP)        —       773

Andy Uba

(APC)     —         43,285

Chukwuma Soludo

(APGA) — 112,229

Geoff Onyejegbu

(APM)         —      301

Azubuike Philip

(APP)         —      139

Okeke Chika Jerry

(BP)  —      186

Obiorah Agbasimelo

(LP)  —      2802

Leonard Emeka

(NNPP)  —          117

Ezenwafor Victor

(NRM)  — 213

Valentine Ozigbo

(PDP) —          53,807

Nnamdi Nwgbo

(PRP) —    437

Uzor Obinna Godwin

(SDP)  —   842

Ifeanyi Ubah

(YPP)         —         21,261

Okonkwo Obiorah Frances (ZLP) — 2, 082.

  O kwukwara na mkpokọta ọnụọgụgụ ndị debànyèrè aha maka ịtụ akwụkwọ n’Anambra dị 2466638, kwuo na ọnụọgụgụ ndị bịara ịtụ akwụkwọ dị 253,388, kwuo na ọnụọgụgụ vootu dị mma dị 241,523; kwuo na ọnụọgụgụ vootu ndị adịghị mma dị 8,108, ma kwukwazie na ọnụọgụgụ vootu niile a tụrụ na nhọpụta ahụ dị 249,631.

  Mpụtara ahụ na-akọwakwa na otu ndọrọndọrọ APGA nwetere mmeri n’ime okpuruọchịchị iri abụọ na otu e nwere na steeti ahụ, PDP nwete mmeri n’otu okpuruọchịchị, YPP nwetekwa mmeri n’otu okpuruọchịchị.

  Lee ka o siri zoo ma gbachaa n’okpuruọchịchị dị iche iche:

Dunukofia

APC           1991

APGA                  4124

PDP           1680

YPP            1360

Awka South

APC           2595

APGA                  12,891

PDP           5498

YPP 919

Oyi LGA

APC           2830

APGA                  6133

PDP           2484

YPP            900

Ayamelum

APC           2409

APGA                  3424

PDP           2804

YPP            407

Anaocha

APC           2085

APGA                  6911

PDP           5108

YPP            868

Anambra East

APC           2034

APGA                  9747

PDP           1380

YPP            559

Idemili South

APC           1039

APGA                  2312

PDP           2016

YPP            752

Onitsha South

APC           2050

APGA                  4281

PDP           2253

GUO:  Ndị uwe ojii Anambra ejidela mmadụ iri na anọ maka wuru-wuru n’oge nhọpụta ọchịchị

YPP            271

Njikoka

APC           3216

APGA                  8803

PDP           3409

YPP            924

Nnewi North

APC           1278

APGA                  3369

PDP           1511

YPP            6485

Orumba South

APC           2060

APGA                  4394

PDP           1672

YPP           887

Ogbaru

APC 1                  178

APGA                  3051

PDP           3445

YPP            484

Onitsha North

APC           3909

APGA                  5587

PDP           3781

YPP            682

Aguata

APC           4773

APGA                  9136

PDP           3798

YPP            1070

Ihiala

APC           343

APGA                  8283

PDP           2485

YPP            344

Idemili North

APC           2291

APGA                  5358

PDP           2312

YPP            902

Ekwusigo

APC           1237

APGA                  2570

PDP           1857

YPP            727

Nnewi South

APC           1307

APGA                  3243

PDP           2226

YPP            1327

Orumba North

APC           2672

APGA                  4787

PDP           1847

YPP           655

Awka North

APC           755

APGA                  1908

PDP           840

YPP            381

Anambra West

APC           1233

APGA                  1918

PDP           1401

YPP            357

  N’okwu ya banyere nhọpụta ahụ, onyeisi ụlọọrụ INEC na steeti Anambra, bụ Dọkịta Nkwachukwu Orji kọwara nhọpụta ahụ dịka nke gara siriri-werere, n’ụzọ udo na n’ụzọ ghe anya oghe, ma kelekwazie ndị Anambra na ndị otu dị icheiche nyere aka ịhụ na ya bụ nhọpụta ọchịchị gara nke ọma ma gakwa n’ụzọ udo, n’agbànyèghị ihe ọdachi na ihe egwu niile dapụtara na mbido nà oge a na-akwado ya bụ ntụliaka.

  N’okwu ya oge ọ na-anabata mmeri ahụ, Ọkammụta Soludo, onye ọñụ jupụtara obi, kọwara na ọ bụ ọchịchọobi Chineke na ọ ga-enwete ya bụ mmeri, maka na ọ bụ Chukwu na-eme eze, ọbụladị dịka o kelekwara ụmụafọ steeti Anambra maka ezi ntụkwasịobi ha nwere na ya na n’otu ndọrọndọrọ ọchịchị APGA, wee nye ya nkwado dị ịtụnanya.

GUO:  Ọtụtụ ndị mmadụ ezigarala Soludo ozi ekele ka ọ natachara asambodo

Dịka ọ na-ekwu na ọ bụ ahọ iri na abụọ gara aga ka ndị Anambra malitere chọba ya ka o jeere ha ozi, bụzị nke Chineke mezịrị ka ọ pụta ihe ugbua, o kwekwazịrị nkwà na ọ gaghị agharịpụ ha, site n’inye aka Chineke na ezi nkwàdo ha.

  O kelere aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ, ndị ndu na ndịisi otu ndọrọndọrọ APGA, na ọtụtụ ndị ọzọ nyere aka ime ka nrọ ahụ pụta ìhè, ma kọwakwa nhọpụta ahụ, usoro na akụrụngwa BIVAS ahụ e jiri mee ya dịka nke magburu onwe ya, n’agbanyeghị na e nwegasịrị ihe iche aka mgba n’ụfọdụ ebe.

  Ọ kpọkuzịrị Ndị Anambra ka ha jisie ike na-akwàdo aka na-achị steeti ahụ ugbua, bụ Gọvanọ Obianọ nà otu ndọrọndọrọ APGA, ka ya bụ ezi ọchịchị dị na steeti ahụ wee na-agawanye n’ihu. Oge ọ na-ekwe ha nkwà ezi njikọaka, ọ dụkwazịrị ndị ọzọ ya na ha zọrọ ọkwa ahụ ka ha nabata mmeri ahụ ma nyere ya aka n’ọrụ ibuli steeti ahụ n’ogoogo dị elu, maka na steeti ahụ bụ steeti ha niile.

  Onyeisiala Muhammadu Buhari, Gọvanọ Willie Obianọ, gọvanọ Benue bụ Samuel Ortom na ọtụtụ ndị ọzọ ọnụ na-eru n’okwu na ngalaba dị icheiche n’ala Nigeria na na mba ofesi ekeleela Ọkammụta Soludo maka nturuugo ya, site n’ozi dị icheiche ha kụpụrụ ụbọchị Wenezdee banyere nhọpụta ọchịchị ahụ.

  Ọkammụta Soludo na osote ya, bụ́ Dọkita Onyekachukwu Ibezim, bụkwazị ndị a ga-edu n’iyi ọrụ iweghara ọkwa dịka gọvanọ na osote gọvanọ steeti Anambra n’abalị iri na asaa nke ọnwa Maachị ahọ 2022, bụ oge agba ọchịchị nke abụọ nke Gọvanọ Obianọ ga-abịa na njedobe.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here