Fada Oraemesi agbaala afọ iri asatọ, mee ncheta afọ iri ise o jiri chie ụkọchukwu

0
7
Fada Ọkammụta Oraemesi (n'etiti), na ndị ọzọ mgbe ọ na-awa achịcha na mmemme ahụ

“ANYỊ nọ ebe a ikele Chineke makai ndu mụ bụ odibo ya etosịghị etosi n’ime afọ iri ise dịka ụkọchukwu tinyere ọgbụgba afọ iri asatọ m. Soro m kelee Chineke. Aja maasị dị asọ bụ ekele kachasị ekele a na-enye Chukwu. N’aha bishọp dayọsis Awka, Most Rev Paulinus Ezeokafor, ụkọchukwu parish bụ Fada Emmanuel Ofomata, ndị kansụl parish (P.P.C) na ndị St Gabriel Parish, Okpuno gozie ụnụ.”

  Nke a bụ okwu nke Fada Ọkammụta Oraemesi ụbọchị ụka ọnwa Ọktoba dị n’abalị iri atọ na otu n’afọ a bụ 2021 dịka ndị ụlọụka St Gabriel’s parish, Okpuno, nke dị n’okpuru ọchịchị Awka South na steeti Anambra chịkọbara oke mmemme gbara mkpị (double celebration) n’aha ya.

  Fada Oraemesi nabatara mmadụ niile si ugwu na ndịda bịa ọkachasị ndị ọkammụta na ụmụakwụkwọ nke Nnamdị Azikiwe University, Awka (UNIZIK) na Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu University (COOU), na ndị si parish dị iche iche ọ rụrụ dịka ụkọchukwu. O kpere ka Chineke gọzie ha n’ebe ọ dị ukwuu.

  N’okwuchukwu ya, Fada Angelo Obiako toro Fada Oraemesi na ogbo ya, Fada John Uchem bụ onye e chiri ya na ya otu ụbọchị bụ onye bịara soro ya ńụrịa.

  Fada Obiako kwuru sị: “Aja ekele ka anyị jiri bịa taa n’aha Ọkammụta Oraemesi, ụkọchukwu katọlik nke mbụ e nwere n’Oraifite. Anam ekele Chineke maka ndụ ya. Ịnabata ibu obe a adịghị mfe. Ọkammụta Oraemesi bụ onyenkuzi maara ihe ekwe na-akụ, e wepụkwa nke ahụ, o biela na parish dị iche iche na-arụ ọrụ Chukwu. Ọ ka na-akụzikwa nkuzi ruo taa.”

  Fada Obiako gbara ama ma kwuo na Fada Oraemesi bụ omepụrụ onye ọ dịịrị, ọ chịrị ọzụọ, onye na-egbo mkpa ndị mmadụ n’eleghị anya n’azụ dịka ọ kọwara na ọ metụtara ya n’ụzọ dị egwu.

GUO:  Fada Oraemesi ga-eme ncheta ọgbụgba afọ iri asatọ n’afọ iri ise o chiri ụkọchukwu, ụbọchị ụka

  Ọ gara n’ihu kwuo: “Njem ụkọchukwu bụ ndụ ihe mgbu, ndụ ịchụ aja, ma Ọkammụta Oraemesi nọ na ya ma na-aga n’ihu. Ọ bụ ezigbo ụkọchukwu, o biri ezigbo ndụ dịka ụkọchukwu na onyenkuzi. Ana m arịọ Chineke ka ọ gaa n’ihu na-enye ha (ma Fada Uchem) ndụ dịka anyị na-elegara nzọụkwụ ha anya. Ha chọrọ ekpere anyị iji gaa n’ihu na-akọ n’ugbo Chineke.”

  N’akụkọ nke ya, ụkọchukwu parish ahụ, Fada Emmanuel Ofomata nyere Chineke otito niile dịka o kwuru sị: “Ana m enye ya ekele maka nwoke hụrụ Chineke n’anya ma na-enwe ezi mmekọrịta n’ebe ndị mmadụ nọ. Okonye nwere obi nwata. Fada Ọkammụta John Chukwuma Oraemesi, ka Chineke na-aga n’ihu n’ịgozi gị. Ọ ga-adịrị gị mma n’ụwa a ma n’ụwa ọzọ.”

  Ụkọchukwu parish nobu St Gabriel, Fada Anthony Nwafo nyere Chineke ekele maka ngọzị ya n’isi Fada Oraemesi dịka o kwuru sị: “Ekele dịrị Chineke maka ezi ndụ. O nwere amara ibi ndụ ruo afọ iri asatọ. Abụọma 9:10 na e nyere mmadụ ohere ibi ndụ afọ iri asaa, ebe iri asatọ bụ maka ndị gbasịrị ike. Ya mere, Ọkammụta so na ndị gbasiri ike. Anyị biri afọ isii ebe a, ọ bụ ezigbo mmadụ, onye udo na onye ekpere, ma bụrụkwa nna n’ebe anyị nọ. Nzọụkwụ ya kwesịrị ńńomi. Ọ bụ onye na-enye ndụmọdụ ma bụrụkwa mmanya nke na-anaghị ezo agwịrịgwa. Ọ maara ihe ọ na-eme. Ọ na-eleba ndụ ya anya nkeọma, ma n’ime mmụọ ma n’elu ahụ, ya mere Chineke ji ahụike gọzie ya. Anyị nọ ebe a isoro ya ńụrịa.”

  Fada Nwafo rụtụkwara aka ma kwuo na Fada Oraemesi tụnyere ụtụ dị egwu oge ha na-arụ ụlọ obibi ndị ụkọchukwu (father’s house).

GUO:  Fada Oraemesi ga-eme ncheta ọgbụgba afọ iri asatọ n’afọ iri ise o chiri ụkọchukwu, ụbọchị ụka

  Maazị Felly Zontal, onye Oraifite kwuru sị: “Emume a dị egwu, ọ bụ emume abụọ a chịkọtara ọnụ. Obi bụ anyị ańụrị banyere ya. Ana m agọrọ ya ọfọ ihe, ọma n’ọdịnihu, tinyere ogologo ndụ n’ụwa a.

  N’akụkụ nke ya, Ọkammụta Ellis Idemobi jibu ọkwa dịka osote onyeisi mahadum Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu University (COOU) kwuru sị: “Anyị na-ekele Chineke n’isi Fada Oraemesi dịka ọ na-echeta afọ iri ise o chiri ụkọchukwu tinyere afọ iri asatọ e ji mụ ya n’elu ụwa a. Ọ bụ ihe ịtụnanya, anyị na-enye Chineke otito niile dịka anyị na-ekpere ya ekpere n’ọrụ ya  n’ebe Chineke na mmadụ nọ. Chineke ga na-aga n’ihu na-akwụ ya n’ụgwọ.”

  Osote onyeisioche kasụl parish, Sir Walter Umeukeje kọwara na ọnụnọ Fada Oraemesi ịhụ ụzọ ime mmụọ nke ọ hụrụ banyere okirikiri ahụ mere ka ha nwee mmepe dị egwu dịka o kwuru sị: “Ọ nọ ebe a dịka nna, obi bụ anyị ańụrị maka na ọ nọnyere anyị.”

  Onye ndu nke mmụọ (Chaplain) nke Achibishọp A.K Obiefuna Retreat, Pastoral and Conference Centre, Okpuno, Fada Maximus Muojeke n’okwu nke ya, kelekwara Chineke maka emume ọńụ abụọ ahụ dịka o kwuru sị: “O nwere obi ọma dị egwu n’ebe mmadụ nọ, ahụbeghị m ebe o kwuru okwu n’olu ike. Anyị na-ekpe ekpere ka Chineke gaa n’ihu na-agọzị ya.”

  N’akụkụ nke ha, ụfọdụ ndị parish ahụ gụnyere Dọkịnta Alfred Emelife, Dọkịnta Nkechi Okoye na Arc. Emeka Gabriel Nwokolo bụ onyeisioche kọmiti haziri emume kelere Chineke ma too Fada Oraemesi aka ọrụ ọma ya ma rịọ Chineke ka ọ na-aga n’ihu inye ya ahụike.

GUO:  Fada Oraemesi ga-eme ncheta ọgbụgba afọ iri asatọ n’afọ iri ise o chiri ụkọchukwu, ụbọchị ụka

  Ihe pụtara ihe e mere na mmemme ahụ gụnyere abụ Fada Melchazedek Chidebere Obi dere ma gụpụta n’ụlọụka nke isiokwu ya bụ ‘Chukwudaalu’, na achịcha bekee Fada Oraemesi wara maka otito nke Chukwu n’ihe ọma abụọ ahụ a chịkọtara ọnụ.

  Ka anyị cheta na ndị ụka Katọlik Oraifite dị n’okpuru ọchịchị Ekwusigo na steeti Anambra, adịla na mbụ mee emume afọ iri ise nke Fada Oraemesi dịka ụkọchukwu ụbọchị ụka ọnwa Julaị dị n’abalị iri na ise, n’afọ a bụ 2021 na St Georges Church Oraifite, dayọsis Nnewi.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here