Egwu ndị Igbo : Egwu nkwa nkwa

0
5

EGWU nkwa nkwa bụ egwu ndị Igbo nke e ji osisi achara (bamboo tree) akụ. A na-akpọ ya nkwa nkwa n’ihi otu ụda ya si ada ma a na-akụ ya.

  Ọ bụ ụmụnwaanyị na-akụkarị egwu nkwa nkwa. O so n’egwu Igbo dịbara gboo, n’oge ahụ ụmụnwaanyị ndị ọgọ mmụọ na-akụ ya ma ha na-eme mmemme. Nke a mere ka ụfọdụ ndị mmadụ chee na ọ bụ egwu ndị ọgọ mmụọ, ma ọ bụghị otu ahụ. E ji egwu nkwa nkwa eto Chineke n’ihi na ọ bụ ya kere osisi achara.Ya mere, ndị ụka na-akụ nkwa nkwa.

  Usoro e si akụ ya bụ na ọkwa nka na-apịchapụta osisi achara, mee ya ọ bụrụ ngwa egwu. Ha na-eji ya aka abụọ, wee na-akụ ya. Ụda ya na-adapụta nke ọma ma na-atọ ụtọ. Ha na-akụ ha a na-agụ, na-agba.

  Ụmụnwaanyị Ụka Orie Umugama Umuchu,  bụ ndị otu Catholic Women Organization na-akụ nkwa nkwa ruo taa.

  E nweghị egwu pụrụ iche a na-agụ ma a na-akụ nkwa nkwa, ọ bụ egwu ọ bụla masịrị ha ka ha na-agụ. Njiri mara ya bụ ụda ya.

Ọmụmaatụ:

Kwaị kwaị kwaị …kwakwai kwai

Kwaị kwaị kwaị…kwakwaị kwaị

GUO:  Egwu ndị Igbo : Egedege

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here