Igba mgba: Egwuregwu na-akwalite ezi mmekọrịta n’ala Igbo

0
4
Ndị na-agba mgba n'amaegwuregwu

ỊGBA mgba (wrestling) so n’otu egwuregwu e nwere n’ala Igbo. A na-esi na ya ama onye bụ dike.

  N’oge gboo, ụmụikorobịa na-apụta n’amaegwuregwu gbaa mgba, a mata aka ka aka, onye karịrị ibe ya. Ogbe na ogbe, tinyere obodo na obodo na-agba mgba. A na-esi na ya enwe ezi mmekọrịta n’ihi na ọ bụ ihe e ji ọńụ eme. A na-agbakwa mgba ma a na-eri ji ọhụrụ. A na-ebido n’oge na-akụzịrị ụmụaka ihe banyere ịgba mgba. Ya mere, a bịa n’egwu ọnwa, mgba so n’ihe egwuregwu ụmụaka na-eme.

  E nwere usoro e ji agba mgba. Tupu a malite ya, a na-akụ ekere mgba ma na-agụkwa egwu dịka ndị ga-agba mgba na-agbapụta n’ọgbọ na-awụgharị ma na-akwadebe maka mgba. Ọ bụrụ na a gbachaa mgba, ya bụ dịka otu onye tụrụ ibe ya n’ala, oke ụzụ na-atụ nke mere na ndị ahụ meriri na mgba ga-amalite gụba egwu ma na-agbagharị ebe niile. A na-esikwa na ya erite ihe onyinye dị iche iche.

  O nwere ndị a na-ama dịka ndị na-agba mgba nke ọma. Ndị dị otu ahụ ka a na-asị na azụ ha anaghị eru ala, nke pụtara na mmadụ anaghị emeri ha na mgba.

  Ọ bụ n’ihi ka ndị Igbo si hụta mgba mere na onye ọbụla na-agba mgba nke ọma ji eji ya aza aha dịka Okamgba, Dimgba, Azụeruala, w.d.z.

  Ka ọ dị ugbu a, mgba na-alazi azụ n’ala Igbo. Ndị mmadụ ejikebezighị ya kpọrọ ihe. Ọtụtụ ụmụaka amaghịzị otu e si agba mgba n’ihi na onweghịzị ebe a na-agba mgba. Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ obodo ka na-agba mgba ma ha na-eri ji ọhụrụ mana ha na eme ya ka ọ bụrụkwa na ha mere, kpatara na ọ naghị amịta mkpụrụ ọ bụla n’ihi na ha na-awụsakwa ya ebe ahụ.

  Maazị Mmadubugwu Nnodum kọwara na ihe kpatara mgba ji ala azụ n’ala Igbo bụ n’ihi na anaghị erizi ezigbo nri. O kwuru na n’oge gboo, ndị Igbo na-eri ezigbo nri dịka akpụ, ji a hụrụ n’ọkụ na nri ndị ọzọ na-eme ka mmadụ gbasie ike. Ma n’oge a, ike adịghịzị mmadụ n’ihi ụdịrị nri a na-erizi. Onye gara mgba n’oge a ga-adaru ala n’ihi na o nwezighị onye ume dị. Ihe ọzọ dịka ibe ya bụ na ụmụikorobịa ugbu a na-ańụ ihe ọńụńụ na-aba n’anya ma na-esekwa sịga nke mere na onwezighị ihe dị ha n’ime. Ihe ndị ahụ asachaala ime ahụ ha ka akwa nke mere na ha na-agagharịzị ka ikuku. Ọ bụ ndị dị otu ahụ ga-apụta mgba? Onye na-agba mgba na-agbasi ezigbo ike, bụrụ dimkpa. A tụọ ụdị ndị ahụ n’ala, ha daa ọ bụrụ ọnwụ.

Okeke Ibe – Mmepe so n’ihe mebiri ịgba mgba n’ala Igbo. Ndị mmadụ na-esizi n’ime obodo na-agafezi obodo mepere emepe. Ndị nọkwanụ n’ụlọ enweghị efe maka mgba n’ihi na onyoonyoo juziri ebe niile. Ha chọọ ilele mgba, ha elee ya na tiivii ma ọ bụ n’egwe ntị. E wepụ nke ahụ, ha na-elezi ihe ndị ọzọ ha chọrọ n’onyoonyoo ndị ahụ, nke mere na ha anaghịzị echeta mgba. Ha na-ahụzị mgba dịka ihe mgbe ochie. Ma ọ bụrụ na e leba anya ma mee ka a malitekwa ịgba mgba, ọ ga-adị mma. Ndị nzukọ ọha obodo (town unions) ga-eleba ya anya. E bidokwa n’oge na-akụzịrị ụmụaka ihe banyere mgba site n’ịchịkọba asọmpị dị iche iche ma na-enyekwa ndị merịrị na mgba ihe nrita. Ọ bụ n’ụzọ dị otu a ka a ga-esi mee ka ọgbọ ugbu a tinyekwa uche ha n’ihe gbasara ịgba mgba.

Chika Chikwuo – Ọ bụrụ na ndị be anyị mezie ihe gbasara mgba n’ụdị ọgbara ọhụrụ dịka ndịọcha si eme, ndị mmadụ ga-etinye uche ha na ya. E mee ya nke na mmadụ ga-esi na ya nweta ego uche onye ọbụla ga-adị na ya n’ihi na ọgbọ a chọrọ ego. Ọ bụghị ịnọkata ịsị nwaokorobịa ahụ zuru oke ugbu a pụta n’amaegwuregwu gbawa mgba, o mechaa ọ laa n’enweghị ụgwọ a kwụrụ ya, ọ gaghị ekwe omume. Sọọsọ ma emere ịgba mgba ka ọ bụrụ ụzọ e si akpata ego, onweghị onye ga-etinye uche na ya.

Ifunanya Uzor – Ụbọchị agbanweela makana taa adịghị ka ụnyaahụ. Ndị Igbo na-agba mgba mgbe ụwa dị n’ụra ma taa ihe agbanweela. Onweghịzị onye ga-achọ ka ọ nọrọ n’ime obodo na-agba mgba ka a na-akụrụ ya aka. Onye ọ bụla chọrọ inyere ndụ ya aka site n’ịchọ ihe ọ na-eme.

Uzokwe Ebere – Obi jọrọ ndị mmadụ njọ n’oge ugbu a n’ihi na onwezighị onye hụrụ ibe ya n’anya. N’oge gboo, ha nwere ezi ịhụnanya n’ime onwe ha, ma taa amaghịzị onye a na-eze. I nwere ike pụta na ị na-agba mgba, a nọrọ ebe ahụ kọọ gị ọgwụ, ọ bụrụ ka ị siri je. Biko onye ọbụla na-ezezi ibe ya eze n’ihi oke ihe ọjọọ juru ụwa taa.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here