Ngige ekwela nkwa ezi nkwado ya n’ọchịchị Soludo

0
3

MINISTA na-ahụ maka ọrụ n’ala anyị (Minister of Labour and Employment) Sinetọ Chris Ngige ekwela nkwa iwudo ọchịchị Gọvanọ a họpụtara na steeti Anambra bụ Ọkammụta Chukwuma Soludo aja n’ukwu.

  O kelekwara ndị ọgba egbe maka itinye mma ha n’ọbọ nke mere ka nhọpụta ọchịchị ọkwa gọvanọ e mere na steeti Anambra gaa sịrịrị werere.

  Ngige, onye bụ otu n’ime ndị ọnụ ruru n’okwu n’otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressives Congress (APC) oge ọ na-ekele Gọvanọ ahụ a họpụtara ọhụrụ bụ Chukwuma Soludo na òtù ndọrọndọrọ ọchịchị ya bụ All Progressives Grand Alliance (APGA) maka ugo ha tuuru kwere nkwa inye ha nkwado iji mee ka ọchịchị ha gaa nke ọma.

  Ngige kwuru sị: “A chọkwuru m ikele ndị Anambra maka ịpụta n’igwe n’agbanyeghị egwu nsogbu, igbu mmadụ na ntọrị a hụtara ọtụtụ izuụka tupu nhọpụta ọchịchị ahụ ewere ọnọdụ.

  Dịka m na-eto ha ka m na-etokwa ndị ọgba egbe ‘known and unknown’ maka ịnụrụ ndị okenye okwu ma ghọta na o kwesịrị ka a hapụ Ndị Anambra ka ha họpụta onye ndu ha chọrọ.”

  Otu o sila dị, Ngige kọwara na mmeri Soludo meriri bụ nnọọ nke bịara na mmezu site na ndidi na nnagide bụ nke o nwere n’ihi agụụ ị gbara ndị nke ya odibo; n’ike ya niile.

  Dịka o siri kwu, Soludo dị ka onye ya maara nke ọma agaghị agharịpụ ndị nke ya.

  Onye Minista ahụ gakwara n’ihu too ụlọọrụ Independent National Electoral Commission, onyeisiala Muhammadu Buhari, ndị ọrụ nchekwa na ndị niile ọnụ ruru n’okwu maka ịhazi nhọpụta ọchịchị ahụ n’udo.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here