Nonye Soludo: Onye ga-anọchị anya Oriakụ Obiano dịka nwaanyị izizi na steeti Anambra

0
6
Oriakụ Soludo

IGBO kwuru okwu sị na nwoke ọbụla na-eme nke ọma nwere nwaanyị nọ n’akụkụ ya. O  wee bụrụ ya, dịka steeti Anambra na-enwe ọńụ maka mpụtara nhọpụta ọchịchị e mere ka ọnwa Novemba dị n’abalị isii n’afọ a bụ 2021, nke e sitere na ya wee kwụba oke mmọnwụ chara acha, Ọkammụta Charles Chukwuma Soludo dịka onye ga-anọchị anya Gọvanọ Willie Obiano; ka anyị cheta na o nwere nwaanyị nọ n’akụkụ ya ma na-enyere ya aka.

  Onye m na ekwu maka ya bụ Queen Frances Nonye Soludo. Ọ bụ ya bụ nwaanyị Chukwu jiri gọzie Ọkammụta Soludo nke mere na ọ ga-anọchị anya Oriakụ Ebelechukwu Obiano ka nwaanyị izizi, dịka di ya bụ Soludo ga-ewerezi ọnọdụ dịka Gọvanọ na-achị Anambra, site n’aka Obiano.

  Ka ọ dị ugbu a, onye ọbụla amatala ihe banyere Soludo, ya mere ka anyị matakwa ihe olemole banyere oriakụ ya.

  Nonye Soludo bụ onye Isuofia nke dị n’okpuru ọchịchị Aguata na steeti Anambra. Nke a pụtara na ya na dị ya bụ Ọkammụta Soludo si n’otu obodo.

  Ọ gara mahadum ala anyị University of Nigeria, Nsukka ebe o nwetere nzere degrii nke mbụ n’ihe ọmụmụ komputa sayensi. Ọ gara n’ihu gụọ akwụkwọ na mahadum dị na mba ofesi, University of Westminister, London, ebe o nwetara nzere ‘masters degree’ n’ihe ọmụmụ mgbakọ na ego (Accounting and Finance).

  Ọ bụ nwaanyị maara ihe ekwe na-akụ n’ụzọ ọbụla. Ọ bụ onyeisi (CEO) ụlọọrụ Healthy Living Foods Ltd nke nọ n’okpuru Royal Foods; ma bụrụkwa onye nọ n’isi ụlọọrụ nke onwe bụ Charles Frances Properties.

GUO:  Nonye Soludo: Onye ga-anọchị anya Oriakụ Obiano dịka nwaanyị izizi na steeti Anambra

  Chineke jị ụmụ isii gọzie ezinaụlọ ya na Ọkammụta Soludo.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here