Soludo ga-arụrụ ọrụ ọma Gọvanọ Obiano na-aga n’ihu – Ezinando

0
4
Ezinando

ODEAKWỤKWỌ ọkpụtọrọkpụ nke ‘Ministry of Tertiary and Science Education’, Dọkịnta Edwin Emenike Ezinando akọwaala mmeri  Ọkammụta Chukwuma Soludo nke All Progressives Grand Alliance (APGA) nwetara na nhọpụta ọchịchị e mere nsonso a na steeti Anambra dịka ekpere Chineke zara ndị Anambra.

  Ọ kọwara na ya bụ nhọpụta ọchịchị gbara nnọọ n’anwụ ihe ndị ọma nọ n’Anambra kpere n’ekpere dịka ọ rụtụrụ aka na tupu e mee nhọpụta ahụ, na ụjọ na nyija (threat) cheere ndị mmadụ aka mgba nke na ọtụtụ echetakwaghị na Chukwu nọ.

  O kwuru sị: “Ndị ọma nọ n’Anambra gara n’ihu na-ekpe ekpere maka udo, ka e mee ya bụ nhọpụta. Anyị nọ na-ekpe ka ezi ọrụ Obiano nwee nhafe nke ga-amalite n’ebe ọ kwụsịrị (continuity).

  Chineke nụrụ mkpu akwa ụmụ ya, dịka ụmụ Isreal mgbe ha na-aga ala e kwere ha na nkwa. Chineke enweghị ike ịgbahapụ ụmụ ya. Ọ maara nke kacha mma, ihe anyị ma bụ ịga n’ihu na-ekpe ‘ka e mee uche gị’. Na nhọpụta a, ana m aga n’ihu na-ebuli Chineke elu. Ndị niile zọrọ ọchịchị tozuru oke dịka Independent Electoral Commission (INEC) họpụtara ha. Onye nke tuuru ugo bụ Soludo nwere ihe niile ọ ga-ewe iji rụrụ ọrụ ọma onye ọ ga-anọchị anya ya na-aga n’ihu dịka Gọvanọ Obiano si kwu na ọ ga-eme karịa.”

  Ezinando kọwara Soludo dịka a kwaa a kwụrụ n’ihe gbasara mmụta, ịhazi akụ na ụba, mmadụ, ego na ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

  Ọ gara n’ihu kwuo sị: “Ihe ọzọ a na-achọ n’ebe onye ndu nọ bụ ihe ndị ọ maara banyere ha (experience) ma Soludo arụọla ọrụ dịka Gọvanọ Central Bank of Nigeria (CBN) ma mee nke ọma, kwụba ọtụtụ ụlọ ọba ego.”

  O kwuru na dịka Soludo bụ mmadụ ọha ma bụrụkwa onye maara ihe ekwe na-akụ, nwere ngalaba dị iche iche na ọ ga-ewulite steeti Anambra n’ogo dị elu nke na ọ ga-abụzi ‘Dubia of Africa’ nke na mba ụwa ga-amata maka ya n’ihi na Anambra ga-esonyezi n’ihe a na-eme, ndị na-arụpụta ihe ọ bụghị ndị na-eri sọọsọ oriri. Ọ ga-esonyere obodo ndị ọzọ dịka Malaysia, Singapore, Korea.

  Ọ gbara ama na Soludo bụ onye umeala, ma bụrụkwa onye na-ege mmadu ntị, onye ga-eme ihe ndị nke ya chọrọ.

  Ezinando gakwara n’ihu site n’ikele Chineke maka ọrụ ọma Gọvanọ Willie Obiano (Akpokuedike Global) rụrụ, onye nke ọ kọwara dịka ide nọ n’isi nkata a kpara maka nhọpụta ọchịchị ahụ.

  Ya mere, o kwuru sị: “Anyị na-ekpe ka Chineke ji ike niile nye Gọvanọ a họpụtara ọhụrụ, Ọkammụta Charles Chukwuma Soludo ihe niile ọ ga-ewe iji mejuputa ebumnuche Ndị Anambra ma gafee gburugburu ya, iji mee ka ụwa ghọta na Gọvanọ Willie Obiano emeghị ihe ọjọọ n’ịkwụba ya ka ọ nọrọ n’isi ụgbọ dIka onye ndu.”

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here