Ugwuanyi akasiela nwaanyị di ya gburu nwa ya nwoke gbara afọ asaa maka ọgwụ ego

0
4
Ugwuanyi

AKA na-achị steeti Enugu, Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi ańụọla iyi na gọọmenti steeti ahụ ga- eme ihe niile o nwere ike ime iji hụ na e nwere ikpe nkwụmọtọ n’ebe nwa afọ asaa, Chimdalu Onyishi nọ, bụ onye nna ya gburu, makai iji ya gwọọ ọgwụ ego.

  N’okwu ya mgbe ọ na-akasi nne nwata nwoke ahụ bụ Oriakụ Ifebuchechukwu Onyishi na ụmụ ya obi na be ha dị na Coal Camp, Gọvanọ Ugwuanyi kwere ya nkwa na gọọment steeti ahụ kwụ ya n’azụ chịm chịm n’oge ihe mgbu ya ahụ.

  Ugwuanyi, onye nke onye ndụmọdụ ya pụrụ iche na mgbasaozi (Special Adviser on Information), Steve Oruruo  nọchitere anya ya kwuputara nwute ya banyere agwa ọjọọ nke Maazị Chidi Onyishi kpara ma kwusie ike na ọ ga-eche aka ghọrọ ihe iwu kwuru.

  Oge ọ na-agụpụta ozi Gọvanọ nke gụnyere onyinye dI puku nari naịra ise (N500,000) maka ọdị mma nke nwaanyị ahụ na ụmụ ya ise ndị ọzọ, Oruruo kwuru na ọdị mma nwaanyị ahụ na-echu gọọmenti ụra, tinyere na ha ga-eji usoro iwu kwuru hụ na ha nwetara ikpe mkwụmọtọ.

  O kwuru sị na ya bụ ọnọdụ jogburu udele na njọ ma sigbuo nkapị n’isi. Ma otu o sila dị, o kwuru na Chukwu bụ Chukwu, na ọ mazuru ihe niile.

  Ya mere ọ gwara nwaanyị ahụ sị: “Gọọmenti ga-akwụ gị n’azụ na njem a. Ọ bụ uche gọọmenti ịhụ na e mere ezi nnyocha na ikpe mkwụmọtọ.” O kwere ya nkwa na gọọmenti steeti Enugu ga-eme ihe  niile o kwesịrị ime iji hụ na e nwere ikpe mkwụmọtọ.

GUO:  Ugwuanyị enyela nwata odibo nne ya ukwu merụrụ ahụ agụmakwụkwọ n'efu

  Ọ gara n’ihu gwa ya sị: “Gọvanọ anyị bụ onye obi ebere, onye ihe banyere mmadụ na-emetụta, uche ya dị n’ebe ọdị mma gị na ụmụ gị nọ, o zitere anyị ka anyị bịa gwa gị na ịgaghị akwụ sọọsọ gị. Gọọmenti ga-anọnyere gị, nye gị nkwado dịka anyị na-ekpe ekpere na Chineke ga-enye gị nghọta ị ga-eji nwe nkasiobi.

  N’aha gọọmenti, ezitere m ka m nye gị na ụmụ gị N500,000, a ga-emekwa ihe ndị ọzọ niile e kwesịrị ime.”

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here