ITỤLỊ nnụnụ elu (nwaeresi na nduru) na mmemme na-ezipụta udo. N’oge dị otu ahụ a na-atụli otu maọbụ ọtụtụ n’ime ha elu site na ngịga (cage) ha ma si ụzọ dị otu ahụ gosipụta ezi ihe nkiri na-enye ọńụ. Ma ọ bụrụ na e meghị ya nke ọma, ọ na-abụ ihe ịjụ obi oyi n’ihi na ha agaghị efeli.
Iji mee ka nnụnụ felie mgbe ọbụla ị tụliri ya elu, ị ga-agbaso usoro iri ndị a:
1. Gba mbọ hụ na onweghị nku ya gbajiri agbaji.
2. Goro nnụnụ ndị a nwụtara ọhụrụ site n’oke ọhịa.
3. Gba mbọ hụ na ha nọ na gburugburu ebe ha ga-enwe ezi nchekwa ma a tụlie ha.
4. Kpọta ndị o doro anya ka ha jiri aka ha tụlie ha.
5. Atụlina ha oge ọnọdụ ụbọchị adịchaghị mma dịka mmiri ozizo.
6. Chọpụta ma ahụ ọ na-arịa nnụnụ ndị ahụ.
7. Chọta nnụnụ ndị gbara gara gara.
8. Gba mbọ hụ na ha riri nri ma ńụọ mmiri nke ọma tupu ị tụlie ha.
9. Ị ga-enye ha ohere ka ha zuo ike tupu ị tụlie ha.
10. E kwela ka ha nọọ ogologo oge na gburugburu ahụ ha anabataghị tupu ị tulie ha elu maka mfeli.