A ga m etinye anya nke ọma n’ihe metụtara ụmụnwaanyị na ụmụaka – Oriakụ Soludo

0
4
Oriakụ Soludọ (nke abụọ n'aka nri), Oriakụ Obiano (nke abụọ n'aka ekpe) na ụfọdụ ndị ọzọ oge ha nọ na mmemme ahụ

IGBO sị a ọ na-adị mma ịkwado ụlọ n’oge tupuu oge ụra eruo.

  Ka ọ dị taa, Oriakụ Nonye Soludo, bụ nwunye Ọkammụta Chukwuma Soludo, onye ahụ a họpụtara ọhụrụ ịbụ gọvanọ steeti Anambra emeela ka a mara na ihe metụtara ọdịmma ụmụnwaanyị na ụmụaka so n’isi sekpụ ntị n’ihe ọ ga-elebàkarị anya ma ọ bụrụ na di ya banye n’ọkwa kpọmkwem dịka gọvanọ steeti ahụ.

  Oriakụ Soludo kwupụtara nke a n’okwu ya n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra, bụkwa ebe ọ nọrọ wee kwuo na ụmụnwaanyị bụ ndị kachasị n’ọnụọgụgụ, bụrụkwa ndị na-atụnye ụtụ nke ukwuu n’ịkwàlìtè mmepe obodo, kọwakwa ụmụaka dịka ọdịnihu nke steeti ahụ.

  O mere ka a mara na ọ bụ eziokwu na di ya enweela ma hazie atụmatụ ihe ọ ga-emegasịrị ụmụnwaanyị ma ọ banye n’ọkwa, mana ya onwe ya ga-agbàkwụnyekwu ihe na ya site n’ịtụpụtasịkwa atụmatụ nke ya na ebumnobi ya banyere ụmụnwaanyị na ụmụaka steeti ahụ.

  Ya bụ agụ nwaanyị gosipụtakwara ezi mmasị o nwere n’ihe gbasaara adịmọcha na ezi ọnọdụ ahụike, ma kwe nkwà na ọ ga-agbasikwa mbọ ike ịkwàlite ezi ọnọdụ adịmọcha na ahụike, buo agha megide ihe dị icheiche na-ewèta ọnwụ nne na ọnwụ nwa na mpahara ebe dị ichiche na steeti ahụ.

  O kelere nwunye Gọvanọ Willie Obianọ, bụ Oriakụ Ebelechukwu Obianọ nà òtù ọrụ obiebere ya bụ ‘Caring Family Enhancement Initiative (CAFE)’ maka itute olileanya ọtụtụ ndị mmadụ na steeti ahụ; ma kwe nkwa na ọ ga-agbasokwa usoro na atụmatụ ahụ, iji gaa n’ihu n’itute olileanya ọtụtụ ndị mmadụ, ọkachasị n’ime-ime obodo dị icheiche, ka ikuku ezi ọchịchị gọọmenti wee kùsa ha.

GUO:  Nonye Soludo: Onye ga-anọchị anya Oriakụ Obiano dịka nwaanyị izizi na steeti Anambra

  Ọ rịọkwazịrị ọhaneze ndị Anambra, ọkachasị ụmụnwaanyị ka ha dọnyere ya ukwu ma nyekwa ya nkwàdo kwesiri ekwesi, ma mekwa ka a mara na ha dị njikere ịnabàtà ọmarịcha atụmatụ ọbụla mmadụ jiri bịa, iji nyere ya aka imezùpùtè ezi ebumnobi o nwere maka ụmụnwaanyị na ụmụaka, na iji bulikwa steeti ahụ n’ogoogo dị elu.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here