Ndị ntorobịa na-ede akwụkwọ n’Anambra emeela emume ịkwanyere Ọkammụta Chinua Achebe ugwu

0
4
Nnabuife (n’aka ekpe) mgbe ọ na-anata ihe onyinye nturugo n’aka Umeadi (n’aka nri) na mmemme ahụ

ÓTÙ ndị ntorobịa na-ede akwụkwọ n’ala anyị (Society of Young Nigerian Writers’ (SYNW), ngalaba steeti Anambra emeela emume ome n’afọ nke e ji echeta odogwu nwoke bụ odee a maara aha ya na mba ụwa niile, bụ Ọkammụta Chinua Achebe. E mere ya bụ oke mmemme na Tuzdee ọnwa Nọvemba a dị n’abalị iri na isii bụ ụbọchị ncheta ọmụmụ Achebe, ma bụrụkwa ụbọchI ha hibere e ji echeta ya. Ọ bụ site na njikọaka nke ọbaakwụkwọ Anambra State Library Board ka ha jiri merube ya, nke e mere na Prof. Kenneth Dike Central E-Library, Awka.

  Emume ahụ kpọkọtara ndị e ji okwu ha agba izu ma bụrụkwa ndị maara ihe ekwe na-akụ na steeti Anambra, tinyere ụmụakwụkwọ si ụlọakwụkwọ dị iche iche.

  Onyeisi ótù ahụ bụ Izunna Okafor na ndị ótù ya nabatara ndị mmadụ nke ọma ma hazie ihe niile n’ụzọ bụ ịgba.

  Onyeisioche mmemme ahụ bụ Ọkammụta Peter Umeadi,  jibu ọkwa  dịka Nnukwu Okaikpe Anambra gọtaara onye ọbụla ndụ ndụ, nka nka ma kwubie okwu sị ka emume ahụ si n’ike na-aba n’ike mgbe ọ na-agọ ọfọ ọjị, n’ihi na ọjị ka ndị Igbo ji amalite emume ọbụla.

  N’okwu mmalite ya dịka Onyeisioche, Ọkammụta Umeadi kpọkuru ụmụakwụkwọ ka ha tinye uche n’ihe a na-eme ụbọchị ahụ iji wee mụta ihe n’ihi na ọ kọwara na ya na-amụta ihe n’ụdị njem ahụ oge ya ka nọ n’ụlọakwụkwọ.

  Umeadi, onye kwuru na nke ahụ bụ nke ugboro abụọ ọ na-arụ Onyeisiokwu n’emume ahụ e ji echeta Achebe kọwara ya dịka odogwu nwoke ma kwuo na ọ nọdụ a nọ taa n’ala anyị bụ nke Achebe dị mbụ depụta n’akwụkwọ ya. N’ajụjụ ọnụ a gbara ya, ọ dụrụ ụmụakwụkwọ ọdụ ka ha na-agụ akwụkwọ Achebe iji dị ka ya.

  Ọ gara n’ihu too Izunna, onyeisi SYNW Anambra maka mbọ ya na ndị ótù ya, tinyere ndị ọbaakwụkwọ ahụ.

GUO:  Igwe Oroma Etiti agbaala ọvala

  Onyeisi (Director) ọbaakwụkwọ steeti Anambra, Dọkịnta Nkechi Udeze bụ onye a nọ n’ụlọọrụ ya wee merube emume ahụ kwuru sị: “Emume a mere ka anyị mata na odee anaghị anwụ anwụ. Ọ na-adịgịde ndụ. Achebe na-ede edemede n’ụzọ onye ọbụla ga-aghọta, ọ bụladị onye nọ mba ofesi na-agụ akwụkwọ ya ọ na-adị onye ahụ ka ọ nọ n’ala Igbo.”

  Ọ gara n’ihu gwa ụmụakwụkwọ sị: “Ụnụ bụ ndị ndụ anyị n’ọdịnihu ga-adị ka ya. Gbaa mbọ gụọ akwụkwọ, lee ule n’onwe gị. Ndị nkuzi kwesịrị ịbụ ndị mgbazị.”

  Udeze kelere ndị okenye maka ịrụ ahụ ha ụka wee bịa emume ahụ, ma kpọkuo ha ka ha na-agụkwa akwụkwọ ọgụgụ Igbo, dịka o kwuru sị: “Ọ bụ njirimara anyị, ihe e jiri mara onye fuo, onye ahụ efukwaala.”

  Onyeisioche ótù SYNW, Izunna Okafor, n’ozi nnabata ya kọwara na ha were Acehebe dịka onye ha na-eso nzọ ụkwụ ya. Ya mere, n’ihi na kemgbe o jiri nwụ o nwebeghị ihe e mere iji mee ka aha ya dị ọkpụtọrọkpụ na ha na-agbasị mbọ ike ka gọọmenti lebaa ya anya n’ihi na e mee nwata ka e mere ibe ya, obi adị ya mma. O kwuru na ọ bụ ya ka ha ji agha ike n’anwụ kemgbe afọ 2016 ha malitere ịchịkọba emume ahụ.

  Okafor gara n’ihu kwuo sị: “Anyị na-achịkọbakwa emume a iji mee ka ndị na-eto eto, na-ede akwụkwọ soro nzọ ụkwụ Achebe tinyere ime ka ndị mmadụ na-ańụrịrị onye mere nke ọma, nke ga-eme ka e nwee mmasị ime ka onye ahụ.”

  Otu o sila dị, o kelere ndị niile obodo jiri birir zara ha oku, ma mekwa ka ha mata ụfọdụ ihe iche aka mgba ha nwere dịka o kwuru sị: “Igbo kwuru na ọ na-abụ e zu oke dibịa agbaara ya afa, ma sịkwa onye rịrị ọjị ya kpara ya nkụ maka na anaghị arị ọjị kwádáá. Ọ bụ ya ka anyị ji chee na ọ ka mma ka anyị were oke ohere a wee kwupụta ụfọdụ ihe na-akpa anyị, dịka anyị nwere ndị ọnụ ruru n’okwu, bụ ndị ga-enyere anyị aka maọbụ mee ka a nụ olu anyị.”

GUO:  Ikwu na ibe ekeleela Chineke ka Nnabuife gbara afọ ọhụrụ

  Onyeisi (MD/CEO) Ananmbra Newspapers and Printing Corporation bụ ụlọọrụ na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa, SportsLight Xtra na Homeland, Sir Chuka Nnabuife, bụ onye nyere nkuzi n’ụbọchị ahụ (key note speaker), ma bụrụkwa onye e nyekwara onyinye nkwanye ugwu ‘award’ kuziri ma gbaa ndụ Achebe n’anwụ.

  O kwuru na ọ bụ odee maara ihe ekwe na-akụ, na akwụkwọ o degara gbasasịrị mba dị iche iche ma bụrụ nke a tụgharịrị n’ihe karịrị asụsụ iri ise. O kwuru na nke ahụ bụ ka o siri gbata kwụrụ n’afọ 2012, na ọ ga-akịrịgo otu ahụ ugbu a.

  Nnabuife kọwara na ntọala Achebe gbadoro ụkwụ n’okpukpere Kraịst, akụkọ ọdịnala ndi Igbo, site n’aka ndị ikwu na ibe ya ma kwukwaa na ụbụrụ ya na-aghọ nkọ ka agụba, na ọ gụrụ akwụkwọ n’ala anyị ma gụkwaa n’ala bekee.

  O kelere òtù SYNW maka ohere ahụ ha nyere ya ikuzi ihe tinyere onyinye ‘award’ e nyere ya.

  N’okwu nke ya, onye eze ọdịnala ụbọchị ahụ, (Royal Father of the day)  Igwe Chidubem Iweka, Eze Iweka III Obosi kwuru sị na Achebe dịkwa egwu ma kpọkuo ụmụakwụkwọ ka ha kee ajị n’ume ma na-agbasi mbọ ike iji gbagoo n’ogo dị elu.

  Igwe Iweka, onye dere abụ atọ n’ime abụ ndị ahụ e buputara ụbọchị ahụ, gwara ụmụakwụkwọ ahụ sị: “Ụnụ nwere isi ọma ịnọ n’ụlọakwụkwọ ugbu a n’agbanyeghị ihe isi ike dị ugbu a. Ụnụ bụ olile anya nke ọdịnịhu.” Ọ gara n’ihu dọọ ha aka na ntị ka ha gbaara ịńụ ọgwụ ike ọsọ n’ihi na ọ ga-aghasa ndụ ha, ma gbochie ha ịbụ ihe ha kwesịrị ịbụ.

GUO:  Nnabuife ebuputala akwụkwọ atọ o dere ọhụrụ

  Onye eze ọdịnala ahụ gụrụ abụ atọ n’emume ahụ n’ihi na agadị nwaanyị anaghị aka nka n’egwu ọ maara agba.

  N’ajụjụ ọnụ a gbara ya, o kwuru na Izunna Okafor na ndị òtù ya na-agba oke mbọ site n’ịhazi emume ahụ kwa afọ ma kwuo sị: “Enwere m afọ ojuju ịnọ ebe a, maka emume a.”

  Ọkammụta Stella Chinyere Okunna si mahadum Nnamdi Azikiwe University, Awka, n’akụkụ nke ya kwuru sị: “Obi bụ m sọ ọńụ taa. Oge ọbụla m hụrụ ụmụaka, ana m ahụ olile anya n’ọdịnihu. Gbasienụ mbọ ike iji mee nke ọma n’ụdị ụwa anyị nọ taa.”

  Ụmụakwụkwọ mere ihe ngosi dị iche iche dịka abụ, egwu, ịgba akwụkwọ Achebe n’anwụ w.d.g. Ha gụnyere Nnamdi Azikiwe University High School, Awka, Igwebuike Grammar School, Awka, St Patrick’s College, Awka, Kings and Queen’s Comprehensive Academy, Ifite Awka, Redeemer International High School, Community Secondary School, Okpuno.

  Gbasara asọmpi edemede (easy competition) nke ụlọọrụ Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC) na-akwado, e nyere ụlọakwụkwọ ndị tuuru ugo na ya asambodo site n’aka Onyeisi ụlọọrụ ahụ, Sir Chuka Nnabuife na Editọ bụ Oriakụ Rose Oranye.

  Ndị òtù SYNW nyekwara ọtụtụ ndị mmadụ onyinye ‘award’; ha gụnyere: Igwe Iweka n’Obosi, Sir Chuka Nnabuife, Bob-Manuel Udokwu, Paul Ifeanyi.

  A nọkwa n’emume ahụ bupụta akwụkwọ abụ nke a haziri ọhụrụ maka ncheta Okammụta Achebe.

  Ndị ọzọ bịara emume ahụ gụnyere John Ifejika, Reginald Ofodile, Oriakụ Ifeyinwa Uzoka, JoY Mbachi w.d.g.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here