E jidela nwata chọrọ ire ụgbọala nna ya ukwu na Calabar

0
35
Ugbe na ụgbọala ahụ ọ chọrọ ire

AKA ndị uweojii na steeti Cross River anwụchiela otu nwata nwokorobịa, bụ onye chọrọ ire ụgbọala nna ya ukwu ma rie mbọmbọ, tupuu nkàtà wee kpudo ya n’ime Calaba bụ isi obodo steeti ahụ.

Nwata nwokorobịa ahụ aha ya bụ Maazị Godswill Ezekiel Ugbe ka e kwuru na ọ chọrọ ire ụgbọala nna ya ukwu n’ọnụego dị ala. Ya bụ ụgboala bụ nke ọnụahịa ya ruru nde naịra atọ (N3m) ka e kwuru na nwaokorobịa ahụ gburu na ntụ, nke na ọ chọzịrị ire ya narị puku naịra atọ na iri ise (N350, 000).

Ọ bụzị oge o nyà ụgbọala ahụ wee na-agakwuru onye chọrọ igo ya na mpaghara okpuruọchịchị ime obodo Akpabuyo ka ndị uweojii nwụchiri ya n’ụzọ

Akụkọ kọrọ na ọ bụ oge ndị uweojii ahụ nọ n’ọrụ ngagharị ka ha hụrụ ya bụ ụgbọala Toyota Camry (nwere akara KT 114 LH), wee nwee mmetụta na ọ dị ka ụgbọala e zuru ezu. Nke a mezịrị ha jiri buru ụgbọala nke ha wee gaba nso ebe ahụ. Kaosiladị, ngwangwa nwokoribịa ahụ hụrụ ha, o jiri ọsọ hugharịa ụgbọala ahụ ozigbo ma tinye isi n’ụzọ mpaghara Bakassi; ndị uweojii ahụ wee chụ ya, chụgide ya ma jide ya.

Nwaokorobịa ahụ ka e kwuru na ọ bụ onye nche ụlọ nna ya ukwu ma bụrụkwa onye na-elekọta ma ụlọ, ụgbọala abụọ na ihe ndị ọzọ niile nwoke ahụ nwere, maka na ya onwe ya bi na mba ofesi. O jikwazịrị ọnụ ya wee sàá asịsà na ọ chọrọ ire ụgbọala ahụ narị puku naịra atọ na iri ise tupu aka wee kpàrá ya.

GUO:  Ndị uweojii Anambra ejidela di na nwunye zuru ohi nwa

N’okwu ya banyere njide ahụ e jidere nwa amadi ahụ, onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti ahụ, bụ DSP Irene Ugbo kelere ndị uweojii ahụ maka ezi ọrụ ha, ma kwezie nkwa na a ga-akpụpụ ya bụ nwokorobịa ụlọikpe n’oge adịghị anya maka ihe ahụ o mere. Ọ gwakwazịrị ndị dị icheiche na-etinye mmadụ n’ụlọ ha ka ha kpachapụ anya ịma ụdị mmadụ ha na-etinye n’ụlọ ha, ọkachasị ilekọtara ha ihe ha nwere mgbe ha anọghị nso.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here