Echiche ndị mmadụ banyere Ekeresimesi ka a bara ọnwa Disemba

0
36

ỌNWA Disemba bụ ọnwa pụrụ iche na ndụ ndị otu Kristi n’ihi na ọ bụ ọnwa e ji agba ekeresimesi, mgbe e ji echeta ọmụmụ Onyenzọpụta. Ekeresimesi bụ emume ma onye ukwu ma onye nta, ma nwoke na nwaanyi, tinyere okenye na ụmụaka na-echekwube. Mgbe ọbụla a banyere ọnwa Disemba, ndị mmadụ na-amalite na-egosipụta n’ụzọ di iche iche na oge ahụ eruoola n’ihi na agha akara aka anaghi eri ngwọrọ.

ụfọdụ na-edozi ụlọ ha, ọ kachasị ndị nwere emume ha ga-eme dika ichii echichi, igba ọfala, alụmalụ di na nwuny, w.d.g. Ha na-agakwa ahịa na-egokọsi ngwongwo na ngwongwo ha ga-eji mee emume. N’ezie, oge ekeresimesi na-abụ oge oriri na ọńụńụ.

N’akuku nke ọzọ, onye maọbụ otu ọbụla na-akwadokwa site n’igọkọ akwa na ihe ekike di iche iche e ji emerube oke mmemme ahụ.

Umụaka anaghi anọ n’azụ n’emume ekeresimesi. E kwube ekwube ọ bụ ha bụ isi a hurụ kwaba okpụ. A na-azụkọtara ha akwa, akpụkpọụkwụ, okpu, ụgọgbeanya, kụlọọkụ a na-agba n’aka tinyere ọtụtụ ihe ekike ndị ọzọ. Ka ọ dị ugbu a, bolom bolom (balloon) bụ ihe ha na-afụ afụ nke na-adị n’ụdị agwa dị iche iche ejula ahịa, n’ihi na ikuku ekeresimesi ekubela. Onye fụọ nke ya, ọ gbawaa o bee akwa, o bechaa, nne na nna maọbụ onye o meturu n’obi egonye ya ọzọ. Ha niile so n’ihe a na-eme banyere ekeresimesi.

Otu o sila dị, dika a banyere onwa Disemba na Wenezdee, otụtụ ndị mmadụ tinyere ọnụ n’okwu, ma kwuputa uche ha, otu ha chere ekeresimesi afọ a bụ 2021 ga-adị. Otu a ka o siri ga:

Samuel: Ekeresimesi afọ a ga-agakwa otu ibe ya siri ga. Onweghi nsogbu ga-adị. N’agbanyeghi na ihe siri ike, ọ gaghi eme ka a ghara igba ekeresimesi nke oma. O bughi taa ka ihe malitere sibe ike, ọ dikwa otu ahụ na mba ofesi, onweghi ebe ụwa tọrọ ute; ihe niile aghasaala. Ma otụ o sila dị, a ga-emezucha ihe niile a na-eme n’ekeresimesi.

GUO:  Ndị ọrụ Anambra ebidola ribe osikapa Ekeresimesi Obiano

A ga-ańụ, rie ma takwaa ma gbaa egbe ‘knock out’. Ana m enwe mmasi n’igba ya nke ukwuu. O na-egosi na ọ bụ ekeresimesi ka a na-agba. Otụtụ ndị mmadụ na-ekwu na ihe siri ike nke ukwuu n’afọ a, n’ihi ya, na agaghi agba ekeresimesi ka o kwesiri. Ma ekwetaghi m. Afọ gara aga ka e nwere ihe iche aka mgba ọrịa korona, ma ọ gbochighi emume ekeresimesi. Ya mere, ebe ọ bu na e mechara gbaa ekeresimesi n’enweghi nsogbu ọbụla n’afọ gara aga, olee ọtụ i siri chee na a ga-enwe nsogbu na nke afọ a? A gbachaala ekeresimesi afọ a tinye jara, ihe ọ sọrọ ya mebe, akịdị abụghị ngwere nta mbụ, ọbụghị taa ka anyị bidoro hụba ihe isi ike.

Obianujuaku Ume: Ekeresimesi abughị sọọsọ maka erimeri. Uwa na-achokari ihe ha ga-etinye n’afọ, ma nke ahụ abụghi ya bụ isi sekpu ntị n’emume ekeresimesi. O bụ eziokwu na a ga-eri ma ńụọ n’ihi ọmụmụ Onyenzopụta ma nke kacha mkpa bụ ndụ ime mmụọ. Ikwụba aka ọtọ na ibi ndụ dị asọ ka a chọrọ n’aka ndị mmadụ dika a na-echeta ọmụmụ ekeresimesi. Onye ọbụla kwesiri inyocha ndụ ya, rịọ mgbaghara maka njọ ya ma mee ezi ebere. ọ bụ mgbe mmadụ mechara ihe ndị a ka ọ ga-enwe ọńụ zuru oke dịka ekeresimesi na-erute nsọ.

Nke ahụ gachaa, ọ kwubezie banyere ihe ọ ga-eri na ihe ọ ga-eyi n’ahụ. Umụ ụwa emeela ka emume ekeresimesi ghọọrọ ha ibu arụ. ọmaricha emume e hibere maka ańụrị ka ụwa tụgharịrị ka ọ bụrụzie emume nchekasị. Onọdụ a di oke njọ, ya mere ana m enye ndị mmadụ ndụmọdụ ka ha were nwayọọ letuo anya ala mara ihe ha kwesịrị ime banyere ekeresimesi maka na ọ bụ emume e doro nsọ, nke a ga-eji obi ańụrị na-anabata afọ ọbụla.

GUO:  Mkpa ọ di ibelata ihe mberede n'oge Ekeresimesi

Arinze Okeke: Emume ekeresimesi na-erute n’ike n’ike, ma ọ ga-aga nke ọma dịka o kwesịrị. Onye ọbụla were ole ego o nwere kwado ya maka na ekeresimesi anaghi agwụ agwụ. Nke afọ a gafee, nke afọ ọzọ na-abia maka na ọnwụ egbughị ji e jiri chụ aja ọ ga-epurịrị ome.

Okwu m were bụrụ ka onye ọbụla kobe akpa ya ebe aka ya ruru. O dị mkpa bụ mmadụ iji ịhụnanya na obi ọma merube emume a. Leta onye i ka mma, nye ndị nọ n’akụkụ gi onyinye ga-abara ha uru n’ekeresimesi. Onye na-eri, ya cheta nwanne ya. ọtụtụ ndị mmadụ agaghị enwe ike igota osikapa ha ga-eri ubọchị ahụ ma ya fọduzie ihe ha ga-eji sie ya. Ndị dị otu ahụ chọrọ enyemaka. Otụtụ ụmụaka enweghi nne na nna na-atụ anya akwa n’aka ndị mmadụ, otu ahu ka onye ọbụla si nwe mkpa dị iche iche chere ya dịka a na-akwado ekeresimesi. ọ bụ ihe ndị a niile na-eme ka ọńụ zuo oke ụbochị ahụ.

John Ike: Ekeresimesi afọ a ga-abịa gafee ka ibe ya. Ihe a dị mbụ eri ka a ga-erikwa, onweghị ihe ga-adi iche. Onweghị onye ga-eri ihe o ribeghi mbụ. Onye richaa, echi ọ gụbakwa ya.

Anyi kwesiri ịghọta na ekeresimesi bụ oge e ji alaru ụlọ, mmadụ na ikwunaibe ya anọkọrịta, nwee ańụrị. Ihe niile abughị maka ego dịka otụ ọtụtụ ndị mmadụ si ahụta ekeresimesi taa. Gosi ndi mmadụ ihunanya n’oge ekeresimesi, ọ gwuchaa ka ọha m n’ọnụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here