Ezenwa etoola Ilonzo maka ịzọ ndụ ya

0
26

OTU nwoke onye Awka Etiti aha ya bụ John Peters Ezenwa egosipụtala ọṅụ ya ka azọtara ndụ ya mgbe o chere na ya anwụọla. O kwuru na ọ bụ Onyeisi ụlọọrụ, Center for Psychic and Healing Administration (CPHA), Dọkịnta Flora Ilonzo bụ onye ya sitere n’aka ya wee dịkwa ndụ ọzọ.

Ezenwa kwuputara nke a na CPHA n’oku Ilonzo kpọrọ ndị ntaakụkọ banyere Ezenwa, tinyere ime ka ndị mmadụ mata ihe ha kwesịrị ịma maka ahụike ha.

Dịka Ezenwa siri kwu,” Ahụ anaghị arịa m ma ihe ikpeazụ m chetara bụ na agara m akwamozu lọta.  Ndị ezinaụlọ m kwuru na ka m nọkatara, amaghịzi m onwe m nke mere ka ha buru m gaa ụlọọgwụ dị iche iche ma onweghị nke nwere isi n’agbanyeghị nnyocha niile e mere.”

Ezenwa, onye e jiri Adịndụ mara, ma bụrụ onye gbara afọ iri asaa anọ, kọwara na ya enweghị mgbe o jiri kwenye n’ọgwụ ọdịnala ma kwuo na ezinaụlọ ya bugara ya CPHA mgbe ha amaghịzi ihe ọzọ ha nwere ike ime. Ya mere, o kelere Chineke maka ịzọ ya ndụ, dịka o kelekwara llonzo ma kọwaa na ya kwụ chịm chịm ugbu a. O kwuru na ọṅụ ndị nke ya lọchighara n’ozuzu oke mgbe ha nụrụ na a zọrọ ya ndụ na CPHA. Ọ gara n’ihu kọwaa na ọ bụ ezi nlekọta nke Dọkịnta Ilonzo nyere ya mere ka ya gbakee n’egbughị oge ma kpọkuo ndị mmadụ ka ha bagide ọgwụ ọdịnala ọkachasị na CPHA.

N’okwu ya, Dọkịnta Ilonzo gbara ama na ọ bụ akwụkwọ aṅara na ‘phyilanthusamarus’ ka ya jiri gwọ ya. O kwuru sị:”Ọ bụ ya bụ onye ọrịa izizi e butere na  nke m ka m mechara emume ọgbụgba afọ iri asaa na ise. Ọ maghị onwe ya mgbe e butere ya.”.

GUO:  Obiano, ndị ọzọ etoola Ilonzo ka ọ gbara ahọ iri asaa na ise

Ọ gara n’ihu kwuo na ya gwara ezinaụlọ ya ka ha fọọ akwụkwọ aṅara nye ya ka ọ ṅụọ. Ekwuru m ka ha jiri aka ha mee ya ka a ghara iche na o nwere ihe ọzọ m tinyere maọbụ mee na ya. O kwuru na Chineke tinyere ike dị egwu n’akwụkwọ aṅara.

Ilonzu kwukwara na Ezenwa nwetara onye ya site na iji mbala(water yam) na ogirisi. Ọ kọwara sị:” Ejiri m ogirisi saa ya isi makana ọ malitela hụba ndị nwụrụ anwụ ma tekwaa ya ji abala n’ahụ niile, nke mere ka o bilie ozigbo.

Ilonzo, onye e jiri Anyafulugo mara gbadoro ụkwụ na ya chọrọ ka ndị mmadụ mata uru akwụkwọ aṅara bara dịka ọ rụtụrụ aka na ọ na-asacha akụrụ (kidney) na imeju (liver).

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here