Gọvanọ Plateau akatọọla mwakpọ ndị na-achị ehi na steeti ahụ

0
29
Lalong

OPEKATAMBE, mmadụ iri na otu atụfụ-ola ndụ ha n’ike ka ndị na-achị ehi (herdsmen) wakporo obodo a kpọrọ Ta’agbe nke dị na Miango, okpuru ọchichị Mangu na steeti Plateau. Ha gbakwara ụlọ ruru iri atọ n’ọnụgụ ọkụ, na mwakpo ahụ bụ nke daputara ka ọ gachara abalị abụọ ha wakporo obodo dị na gburugburu ahu bụ Ancha e ha gburu mmadụ abụọ.

  Odeakwụkwọ Zuzugbe Irigwe Development Association (IDA), Danjuma Auta kwuru na ya bụ ihe mere eme n’ezie ma kọwaa na ndị oji egbe ahụ wakporo obodo ahu n’ihe dịka elekere iri nke abali ma kwaa igbo ihe ruru awa atọ n’enwegh ndị ọrụ nchekwa gbatara ọsọ enyemaka.

  O kwuru na ha chị uche n’aka n’ihi na ha na ndị Fulani ndi ha ma anokọọla ọnụ ọtụtu oge kpaa maka udo, ma oke mwakpo ha malitewkwara na-eme ha mere ka ọ gbagwojuo ha anya, nke na ha amaghịzi na  nkata udo ha na ha kpara ọ dịzikwa ka ha siri kwu. Onye Uweojii na-ahụ maka mmekọrịta ha na ndị mmadụ (PPRO) na steeti ahụ, Ubah Gabriel Ogaba, osote supritendent (Assistant Superintendent), kwuputakwara banyere nwakpo ahụ ma kwuo na e gburu mmadụ iri, gbaa ụlọ iri atọ ọkụ.

O kwuru si na ka ha nwetachara mkpesa banyere nwakpo ahụ, bụ nke rutere n’oge dịka mgbe o ji ọkara gafee elekere nke mbu ụzọ ụtụtụ, kọmishọna ndị uweojii kọmandị steeti Plateau, CP Barlholomew N. Onyeka zipuru igwe ndị ọrụ ha ozigbo iji gbochie nwankpo ahụ iga n’ihu. O gara n’ihu kwuo sị : “komishọna uweojii mechara zipu ndị ogo ha gbagotere n’ọrụ (Senior officers) ka ha gaa lekọta ka ya bụ njinji siri ji, ma kasikwaa ndi o metụtara, obi. Kọmishọna enyela ntuziaka maka ime ezi nnyocha ma kwe obodo ahụ nkwa njikere ọ dị ịchọpụta ndị kpara arụ ahụ”

Otu o sila di, aka na-achị steeti Plateau, Gọvanọ Simon Bako Lalong egosipụtala mwute o nwere banyere mwakpo ahụ e mere na Ta’agbe, ebe e gburu ọtụtụ ndị mmadu, nke gunere ụmụaka, ma gbaa ọtụtụ ụlọ ọkụ. Lalong, n’ozi ya nke onyeisi mgbasaozi (Director of Press and Public affairs), Dokina Makut Simon Macham binyere aka na ya kwuru na ya bụ ọdachi bụ ihe mwute ọzọ nke sitere n’aka ndị itinye ụjọ, ihe mgbu na nwute n’ebe ndị mmadụ nọ. O kpokuru ndị orụ nchekwa ka he kee aji n’ume, ma jide ndị kpara arụ ahụ, ka ha were anya ha hụ ntị ha.

Gọvanọ ahụ gara n’ihu nye Plateau State Emergency Management Agency (SEMA) na  Peace Building Agency (PBA) ntụziaka ka ha wụchaa ozigbo n’ebe ahụ e mere mwakpo ma lekọọ otu ihe ndi e mebiri ha, iji wee gbatara ndị mmadụ ọsọ enyemaka. O kpọkukwara ndị obodo ka ha nyere ndị ọrụ nchekwa aka site n’izi ha ozi ọbụla nke ga-eme ka a chọpụta otu mmiri si baa opi ụgbọgụrụ

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here