Na Libya, aghọrọ m ohu, gbaa ashawo – Nwaagbọghọ Nigeria si Libya lọta

0
29
Ndi si Libya

OTU n’ime ụmụ Nigeria si mba Libya lọta, ndị ọnụọgụ ha dị otu nari na iri asaa na abụọ (172), akwaala arịrị maka njem ahụ. O bụ n’ọdụ ugboelu, Murtala Muhammed International Airport, Lagos, ka ha wụchara.

Dịka ọ na-akọwa ka ya na ihe siri me na Libya, Omoniyi Azizat gbara afọ iri abụọ na otu si Lagos kwara arịrị otu ya si rafuo nna ya nke mere ka o nye ya nari puku naịra asato (N800, 000) iji wee gaa Libya, n’ihi na ya chere na Libya ga-adị ka London.

O kwuru sị: “Ka m nọ na nchekwa nke nna m, otu enyi m gwara m ka m bịakwute ya n’Ibadan ebe a nọrọ mee ka m mata banyere ime njem ga Libya ebe agwara m na m ga na-arụ ọrụ, a na-akwụ m narị naịra iri na abụọ (120, 000) ọnwa ọbụla. Aghọrịrị m  nna m, si ya na a chọrọ m ibido ahịa (business) nke mere ka o nye m N800, 000, ma ejiri m ego ahụ bagide njem Libya, site n’ọzara (desert). Ka m ruru Libya, aghọrọ m ohu na onye ashawao; anaghị m asị asị, enwetara m ego ruru (equivalent) nde naịra abụọ iji gbapụta onwe m n’aka onye kpọfere m. Achọrọ m ilaghachi azụ n’ụlọ akwụkwọ, akwụsịrị m agụmakwụkwọ na SS2, amụtakwanụna m ihe bụ nke dị oke mwute.  A lara m ndụ m n’iyi.” Azizat gara n’ihu kwuo na ya amaghịzi ebe nna ya nọ dika ya tufuru ihe n’ile ya chere na ya ga-eji lọta ụlọ oge ndị uweojii wakpochara ha ma tụkpuo ha niile n’ụlọ mkpọrọ. O kwuru na a napuru ha akụ na ihe niile ha nwere. Site otu ahu ka o siri tụfuo ekwenti nke akara nọmba o ji enweta nna ya dị.

Ka o rubeghị awa iri abụọ na anọ e siri mba Libya bulata ndị Nigeria dị 158 n’onụọgụ site na mba Libya ka e bulatakwara ndị ozọ dị 172 n’ọnụogụ. Nke ahụ mere ya ọnuọgụ ndị Nigeria dị nari atọ na iri atọ (330) bụ ndị tọgbọrọ n’efu e si mba ahụ bulata ala Nigeria site na European Union.

Ndị ahụ niile so na ndị amaghịzi ihe a ga-eme ma bụrụzie ndi na-akwụgharị ka aturu n;enweghị onye nche na Libya.

Ndị nke ikpeazu a e bulatara dị 172 dị ụmụnwoke iri iteghete na abụọ (92), ụmụaka nwoke isii, na ụmụaka nwoke e ku n’aka dị iteghete, tinyere ụmụnwaanyi iri ise na atọ (53), ụmụaka  nwaanyi iri na abụọ (12) na ụmụaka nwaanyi e ku n’aka dị atọ.

Ka ha wụchara n’ọdụụgbọelu Murtala Muhammed International Airport, Ikeja, ndị National Emergency Management Agency, (NEMA) nabatara ha.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here